Newcastle vs Man United: E chiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland'

Ebe foto si, Matthew Peters
'Aga m akọrọ onye akwa ụwa m' bụ akwa Manchester United bere mgbe Newcastle United meriri ha n'asọmpi Premier League.
Mmeri a bụ ihe mgbawa obi nye Man United n'ihi otu goolu Newcatle nyere ha bịara na ngwụcha oge.
Otu egwuregwu bọọlụ abụọ ndị a foro ntụtụ taa n'ime ọkara mbụ n'asọmpi ahụ.
Mana goolu a si n'aka Mathew Longstaff dị afọ iri na itoolu nke Newcatle bịara na nkeji 72 n'ime ọkara abụọ.
Man United siri ọnwụ etu ha nwere ike iji mere onwe ha aha mana Newcastle kwechiri ruo ngwụcha asọmpi.
Nke a na-abụ ugboro atọ a na-emeri Manchester United n'afọ 2019 banye 2020 na Premier League.
Otu ọkpụ goolu a e ji merie Man United dosara ha n'ogogo iri na abụọ na tebụlụ asọmpi Premier League.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









