Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba

Paul Adefarasin, Kerry Washington na David Adeleke.

Ebe foto si, Getty Images/Paul Adefarasin/Instagram

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị Igbo tụrụ ilu sị na "Ọgọ bụ chi onye"

Ya mere anyị ji bido ngụkọ ọgọ ndị Igbo nwere na mba na-eme ha ihu ọma.

Akụkọ a ga-egosi ndị aha ha na-ada ụda na mba niile bịara ala Igbo maka ịlụ di maọbụ nwunye.

Lee ụfọdụ ndị ọgọ ndị Igbo ji eme ọnụ.

David Adeleke (Davido)

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

David Adeleke maọbụ Davido bụ onye otiegwu si mba Naịjirịa ude ya n'ede n'ụwa niile.

Ọ bụ onye obodo Ede dị na Ọshụn steeti.

N'ọnwa sepụtemba afọ a ka ọ gbanyere enyi ya nwaanyị bụ Chioma Leonard mgbaaka alụmdịnanwunye mana ha agbabeghị akwụkwọ.

Kerry Washington

Kerry Washington na Nnamdi Asomugha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kerry Washington na Nnamdi Asomugha

Kerry Washington bụ onye obodo Bronx dị na mba Amerịka.

Ọ bụ onye ome ihe onyonyo a ma ama na Hollywood nke mba Amerịka. Nke kachasị eji mara ya bụ "Scandal"

Ọ lụrụ Nnamdi Asọmụgha n'afọ 2013. Ha ji ụmụ abụọ

Rotimi Akeredolu

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Rotimi Akeredolu bụ otu n'ime ndị ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bụ SAN n'aha ịchafụ.

A mụrụ Akeredolu n'obodo Ese Odo dị na Ondo steeti.

Ọ lụrụ nwunye ya bu Betty Anyanwu-Akeredolu n'afọ 1990. Ha ji ụmụ anọ.

Fani Kayode

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Femi Fani Kayode maọbụ FFK dịka aha a na-etu ya bụ onye Ile-Ife Oshụn steeti amụrụ na Legọs.

Ọ bụ onye ọkaiwu na onye ọma mbem rụburu Naịjirịa ọrụ dịka Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu site n'afọ 2006 rue afọ 2007.

Ọ lụrụ Precious Chikwendu n'afọ 2014. Ha ji ụmụ nwoke anọ.

Paul Adefarasin

Skip Instagram post, 3
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 3

Paul Adefarasin bụ onye obodo Ijebu ode na steeti Ogun nke Naịjirịa.

Adefarasin bụ ụkọchukwu ụlọụka "House on the Rock" nke ọ wụlitere n'afọ 1994.

Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ifeanyi Paul Adefarasin n'afọ 1995. Ha ji ụmụ atọ

Ibrahim Badamosi Babangida

Ibrahim Babangida na nwunye ya nakwa Okparaeze Charles na Lady Diana bụbu nwunye ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ibrahim Babangida na nwunye ya nakwa Okparaeze Charles na Lady Diana bụbu nwunye ya

Ibrahim Badamosi Babaginda bụ onye obodo Minna dị na Naịja steeti.

Ọ bụ ọchịagha chịrị ala Naịjirịa site n'afọ 1985 rue afọ 1993.

Ọ lụrụ Maryam King Okogwu n'afọ 1969. Ha mụrụ ụmụ anọ mana Maryam nwụrụ n'afọ 2009.

Ivara Esege

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ivara Esege bụ di ọdeeakwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Ngozi Adichie.

Esege bụ onye si mba atọ bụ Naịjirịa, Briten nakwa Amerịka

Ọ bụ dọkịta Bekee na'obodo Maryland na mba Amerịka bụ ebe ya na ezinaụlọ ya bi.

Ọ lụrụ Chimamanda Adichie n'afọ 2009, ha mụta otu nwata nwaanyị.

O nwere ndị ọzọ ị chere kwesiri ịnọ ebe a?

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị