Queens College Yaba: Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ ha ọzọ?

Ụlọakwụkwọ Queens College
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ atọ nwụrụ n'ụlọakwụkwo a n'afọ 2017

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ esila n'ụlọakwụkwọ obibi na Queens College Yaba laa bee ha ịnata ọgwụgwụ maka ọrịa.

Ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche enyela ọnụọgụgụ ndị lara site na 700 rue 1000 mana amabeghị nke bụ eziokwu.

Otu nne nwere nwa n'ụlọakwụkọ ahụ achọghị ka enye aha ya kwuru na ụmụ ya ka nọ n'ụlọakwụkwọ

"Ụmụ m na-eme ọfụma, onye na-elekọta ha gwara m ya n'ekwentị" ka o kwuru.

Ọ gwakwara BBC Igbo na ọ nụrụ na ọtụtụ ụmụakwụkwọ agbalaala bee ha n'ihi ọrịa amaghị aha ya.

Otu onye ntaakụkọ BBC nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ na-agbalị ịchọpụta nke bụ eziokwu maka okwu a.

Cheta na ụmụakwụkwọ atọ nwụrụ n'afọ 2017 na Queens College maka mmiri ọjọọ ha ṅụrụ.

Ọtụtụ nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ kwetere na n'ezie na ọrịa amaghị aha ya bụ nke metụtere ọtụtụ ụmụakwụkwọ batara ya bụ ụlọakwụkwọ.

Otu nwoke aha ya bụ Damian kwetere na ya bụ ọrịa metutere nwa ya mana ọ gbakeela.

Queens School Yaba
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ gbakelara lọtara ụlọakwụkwọ

Damian sị " ndị ụlọakwụkwọ ahụ kpọrọ m ka m bịa buru nwa m maka na ahụ adịghị ya. Mgbe m ruru ebe ahụ, ahụrụ ọtụtụ ụmụaka na gbagharị anata ikike ịla ulo".

Ọ sị na-agwọro nwa ya ọrịa ịba na nje n'ụlọọgwụ mana ọ gbakeela ugbua.

Damain sị "nwa m agbakeela ịlahachị ụlọakwụkwọ mana ha sị ka ọ ṅụchaa ọgwụ ya tupu ọ lahachi".

Nne na nna ụmụaka ụfọdụ sị na ọrịa batara na ya bụ ụlọakwụkwọ ebe ụfọdụ na-agbagha ya.

Nke a mechere ka akụkọ pụtara na ọbaozi na ụbọchị Tuzde na ọrịa amaghị aha ya batara na ya bụ ụlọakwụkwọ nke metutara tụtụ ụmụakwụkwọ.

Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Legọs steeti sị na ha na-etinye anya na ụlọakwụkwọ ahụ na ndị ọzọ ka ha mata ebe ya bụ mmiri sị banye opi ụgbọghụrụ.

Gọọmenti kwetere na n'ezie na ihe ruru mmadụ 89 anatala ọgwụgwọ maka ọrịa gbasara ekumume n'obere ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC jikwa anya ya abụọ hụ ndị ọrụahụike steeti bịara ịme nyocha ebe ahụ.

Mgbe ndị ọrụ anyị gara ebe ahụ, ndị ụlọakwụkwọ ahụ ekweghị ka ha banye n'ụlọakwụkwọ ahụ maọbụ zaa ajụjụ ọbụla kama ha huru ụmụakwụkwọ ndị gbakerela n'ọrụ bụ ndị laghachitere ụlọakwụkwọ ahụ.

Queens School

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ndị ọrụahụike steeti bịara nnyocha

Akụkọ ga-amasị gị