Nigeria Independence day : Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu okpụrụkpụ ndị a Buhari kwuru

Ebe foto si, Twitter/APC Nigeria
Onyeisiala Muhammadụ kwuru na ụbochị mbụ nke Oktoba nke afọ ọbụla na-abụkarị mgbe eji eṅomi ma kele Chukwu maka ihe ndị o merela Naịjirịa.
Anyị ga-achịkọtara ụnụ ihe niile o kwuru n'ụzọ asatọ a.
Nchekwa
Onyeisiala Buhari kwuru kelere ndị agha na ndị uweojii etu ha si agba mbọ ịhụ na Naịjirịa nwere ezigbo nchekwa.
O kwuru na ọchịchị na-agbasị mbọ ike ihụ na ha gboro nsogwu ndị Niger Delta na-enwe ma hịcha Ogoni bụkwa nosgbu gburugburu ebe ahụ nwerela kamgbe.
O kwuru na mpụ eji kọmpụta arụ na-arị ibe ya elu mana ha ga-agba mbọ hụ na ya bụ agwa ọjọọ biara na njedebe.
Akụ na ụba Naịjịrịa
Buhari kwuru na ọ ga-agba mbọ hụ na akụ na ụba Naịjirịa kwụsie ike ma bụrụ nke onye ọbụla ga-enwe ohere isonye mee ka o wulite nkeọma.
Anyị ga na-agba mbọ ihụ na anyị chọtara ụzọ ndị ọzọ anyị ga-eji wulite akụ na ụba Naịjirịa ma na-emekwa ka ego anyị na-enwete na mmanụ agbịdị na-aba nnukwu uru.
2nd Niger Bridge
Anyị ga-arụcha akwa mmiri a n'afọ 2022.
Cheta na akwụsịrị ọrụ ebe ahụ nso nso a.
Ntụbata nri
Anyị agaghị alaghachị n'itụbata nri na Naịjirịa ma na-ebupu ọrụ anyị nye ndị ofesi.
Otu Economic Advisory Council
Buhari kwuru na okpokobara otu a ka ha wee mee ka ihe ụfụ nwereike ịpụta n'ụfọdụ mkpebi ha mere maka akụ na ụba Naịjirịa ghara inye ụmụ Naịjirịa nnukwu nsogbu.
"Anyị ga-agba mbọ tinyekwuo ego n'agụmaakwụkwọ, ahụike, mmiri na idiọcha na ịhụ na nri gbara kasaa."
Ibuso mpụ agha
Mpụ na nrụrụaka na-abawanye ụba n'obodo mana "a na m arịọ ka steeti niile nọ na Naịjirịa hụ na mere ndị si ebe kwụba aka ha ọtọ n'ebe ego dị.
Buhari kwuru na "Ministry of Justice", otu dịka "Independent Corrupt Practices Commission", Economic and Financial Crimes Commission, ga-aga n'ihu na-ebuso mpụ agha.
Ọ rịọkwara ụmụ Naịjirịa ka ha kpesa ma ma aka gbasara omume mpụ ọbụla ha hụrụ n'akụkụ ha ka obodo kwụsị ịbụ nke eji mpụ na nrụrụaka wee mara.
Na Nchịkọta,
Buhari kwuru na na-agbanyeghị nsogwu niile Naịjirịa nwere ugbua, ọ ga-akwụsị ike karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na anyị niile jịkọ aka mee ka ezigbo ọchịchị na nwulite akụ na ụba tọọ atọ n'obodo.
Ọ na-rịọ ka ụmụ Naịjirịa chekwa obodo ha n'aka ndị na-achọghị ọganihu ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọktoba dị ezigbo mkpa nye ndị Naịjirịa, ọ bụ ụbọchị Naịjirịa nwere onwe ya site n'aka ọchịchị ndị Briten.
Taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 2019, Naịjirịa na-echeta ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ iri ise na itoolu (59yrs).
Lee ụfọdụ ihe ndị dị mkpa banyere ụbọchị nnwere onwe Naịjirịa:
Etu aha 'Naịjirịa' si pụta

Ebe foto si, Getty Images
Onye chepụtara aha a 'Naịjirịa' bụ Flora Shaw nwunye Lord Lugard.
Lord Lugard bụ onye agha mba Briten kpokọtara mpaghara niile mejupụtara Naịjirịa ma bụrụ gọvanọ-ọchịchị mbụ nke Naịjirịa.
Flora wetara echiche site n'osimmiri Naịja nke mere kpọọ ya mpaghara 'Naịjirịa'.
Ndị nna nna hiwere Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
'A sị na onye a na-akpọ nwere nke ọ na-eme', ya mere ndị a bụ ndị gbara ezigbo mbọ ịhụ na Naịjirịa nwere onwe ya n'afọ 1960.
Ndị a gụnyere;
Nnamdi Azikiwe - E ji 'Zik' mara ya, ọ bụ onyeisiala mbụ nke Naịjirịa mgbe ha nwechara onwe ha.
Obafemi Awolowo - O hiwere atụmatụ agụmaakwụkwọ n'efu na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa na otu a kpọrọ 'Action Group'.
Ahmadu Bello - Ọ bụ ya hiwere otu 'Northern People's Party (NPP) n'afọ 1951 mana ya na Nnamdi Azikiwe mechara hiwe NCNC iji zọta nnwereonwe n'aka ndị Briten.
Abubakar Tafawa Balewa - Ọ bụ ya bụ Praịm Mịnịsta mgbe Naịjirịa nwere onwe ya n'afọ 1960 nakwa 1964.
Etu ndị Naịjirịa ji echeta nnwere onwe ha

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụafọ Naịjirịa niile na-ele anya maka ụbọchị ncheta nwereonwe ha n'aka ndị ọcha 'Briten'.
Site na mgbasa ozi onyeisiala na TV nakwa Radio rue n'ọtụtụ egwu ọdịnala ụmụakwụkwọ na-agba, tinyere ụbọchị ezumike a tụkwasịrị n'elu ya.
Nke a na-enye ndị mmadụ ohere ịtụgharị uche n'ihe niile Naịjirịa riterela kamgbe nnwereonwe ya.
Akụkọ ndị ọzọ dị mkpa banyere Naịjirịa
- Ọktoba 1, 1960 - Naịjirịa nwere onwe ya site n'aka ọchịchị ndị Briten.
- Ọktoba 1, 1961 - Ndịda Kameruun kewapụrụ na Naịjirịa ma bụrụ zie Kameruun site na ntuziaka otu United Nation.
- Ọktoba 1, 1963 - Naịjirịa ghọrọ Steeti nwere ike ọchịchị nke ha bụ 'Republic' na Bekee.
- N'afọ 1967 ruo 1970 - Naịjirịa lụrụ aghaime a kpọrọ agha Bịafra mgbe Ojukwu chọrọ ka ndị Igbo kewapụta onwe ha dịka obodo pụrụiche nke ya.
- N'afọ 1975 - A na-ere ụgbọala ọhụrụ puku naịra abụọ (N2000).
- N'afọ 1975 - Ego ụgọelu eji aga Lọndọn bụ otu natị naịra (N100).
- N'afọ 1976 - Kobo iri asaa na ise (75Kobo) bụ otu Paụndz ndị Briten ebe kobo iri isii (60Kobo) bụ otu dọla (1$).
- N'afọ 19









