'E jichiri m, jụ ịhapụ m mgbe m chọpụtara na ha ga-ere nwa m'
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo & Chiemela Peter Mgbeahuru
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Kirie ebe otu nwaanyị so na ndị anwụchịrị n'ụlọ ndị Uweojii kpọrọ ụlọ mgbere nwa:

Ndị uweojii Naịjirịa anwụchiela ụmụnwaanyị iri na itoolu dị ime nakwa ụmụaka anọ nke nwa ọhụrụ abụọ so n'ime ha site n'ụlọ ebe a na-agba mgbere nwa ọhụrụ na Legọs.
Ụmụnwaanyị ahụ si n'afọ iri na ise rue afọ iri abụọ na asatọ nakwa ụmụ nwaanyị abụọ anwụchiri bụ ndị na-elekọta ha anya ga-abanye n'aka ngalaba na-alụsọ mgbere mmadụ agha bụ NAPTIP n'aha ịchafụ.
Ndị uweojii gwara BBC na e ji puku narị naira atọ na puku narị naira ise arata ụmụ nwaanyị ahụ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị dara ogbenye.

Otu nwaanyị n'ime ha kọwarala ndị ntaakụkọ BBC na e jichiri ya jụ ịhapụ ya mgbe ọ chọpụtara na a ga-ere nwa ya ma ọ chọ ịgbapụ.

Onye ọzọ n'ime ha kwukwara na anaara ya ekwentị ya na ego niile o ji ma kwụsị ya ịga ụlọọgwụ n'agbanyeghị ọnọdụ ya.

Otu n'ime ụmụnwaanyị e jichiri so elekọta ụmụnwaanyị ahụ dị ime kwetara na ọ chọpụtara na ebe ọ na-arụ ọrụ na-agba mgbere nwa ọhụrụ mana egwu ekweghi ya ga na ndị uweojii.
Nke a abụghị mbụ a ga-ejide ndị na-agba mgbere nwa ọhụrụ nke ndị uweojii nwụchiri.

Ndị uweojii kwukwara na ha etinyela anya n'ala n'ime nnyocha banyere okwu a rue mgbe a ga-enweta ikpe ziri ezi.














