Child Trafficking: A nwụchiela nwaanyị rere nwa ya

Nwaanyị na nwa ya o rere

Ebe foto si, Imo Police

Ndị uweojii Imo Steeti nwụchiri otu nwaanyị rere nwa ya n'ọnụ ego dị puke naịra 500 n'ụbọchị 1 Ọgọst, afọ 2019.

Nke dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steti bụ Ikeokwu Godson Orlando wepụtara.

Nwaanyị a kpọrọ Chinasa Ukoha dị ime ọnwa asatọ ma hapụ ụlọ ebe ọ gwara di ya na ọ na-aga n'ụlọ nwanne ya n'obodo Ubomiri dị na Mbaitoli.

Mana di ya bụ Promise Ukoha mechara chọpụta na Chinasa nwunye ya tụrụ ya asị ọcha.

Dịka otu ọnwa gachara, Promise nwetere ozi n'ekwentị na nwunye Chinasa mụrụ nwa nwụrụ anwụ.

Ndị rere nwa a mụrụ ọhụrụ

Ebe foto si, Imo Police

Mgbe ọ sịrị ka e gosi ya ozu nwa ya ahụ, nwaunye ya gwara ya na okechiri ya n'akpa wakịrị wakịrị ma tufuo ya.

Mana di ya wepụrụ akụkọ n'aka ndị uweojii nke mere ha ji malite nyocha banyere nke a.

Ndị uweojii nwụchiri Chinasa, onye mechara kwuo na o rere nwa ahụ, resi ya n'aka Amadi Chioma n'ọnụ ego puku naịra 500.

Chinasa sị ndị nọọsụ abụọ bụ Dorathy Esemonu na Eke Cathrine nyeere ya aka ree nwa ya ahụ.

Dịka ọ dị ugbua a chọtala nwa ahụ ebe nyocha na-aga n'ihu banyere ya.

Akụkọ ga-amasị gị: