Anwụchiela di na nwunye na-ere ụmụaka n'Imo
Akụkọ ndị dị mkpa

Ebe foto si, Getty Images
Aka akparala otu di na nwunye n'Imo steeti maka orure ụmụaka gụnyere nwa ha nwoke.
Ndị uweojii nwuchiri Ugochukwu Nwachukwu na nwunye rere nwa ha bụ Marvellous n'ime obodo Umueme Obike n'okpuruọchịchị Ngọr Ọkpala

Ebe foto si, @officialEFCC
Onyeisioche otu ndị gọvanọ Naịjirịa bụ Abdulaziz Yari nke Zamfara steeti akatọla mmachi ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka bụ EFCC tinyere n'akụnaụba Benue steeti.
Ọ sị na atụmatụ a ga-etinye steeti ahụ n'ezigbo ahụhụ.
EFCC kwuru na ọ bụ maka mpụ gọọmentị Benue na-eme ka ha ji machie ya bụ mmachi.
N'akụkọ ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ego mmanụ agbịdị adatuola dịka mba China na mba Amerịka na-ama aka gbasara ọzụzụ n'orure ngwa ahịa ha.
Mba China manyere pasentị iri abụọ n'ise n'elu ụgwọ ụtụ mba Amerịka ga-akwụ iji bubata ya bụ mmanụ na Chịna.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Kepa Arrizabalaga bụ bụ onye nche bọọlụ otu Athletic Bilbao ebinyela aka n'otu Chelsea dịka onye nche ọhụrụ ha.
Cheta na Thibault Curtois cheburu Chelsea bọọlụ agafeela n'otu Real Madrid ugbua.
Gee nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe nkiri nke taa:













