Border closure: 'Gọọmentị agwaghị anyị tupu ha emechie Border' - Ndị na-atụbata ahịa

Ọnụ na-ekwuru ndị 'Association of Nigerian Licence Custom Agents' (ANLCA) bụ Austin Nwosu kwara arịrị sị na mmechị e mechiri oke ala Naịjirịa na Benin Republic bụ oke njọ ahịa dịri ndị otu ha.
Ọ sị na gọọmentị agbaghịrị ha ama tupu e mechie okeala a nke bụ na ahịa ndị mmadụ bitere ego zụọ ka tọrọ n'ụzọ.
Nwosu sị na ya bụ "Okeala e mechiri n'ọnwa asatọ nke afọ a bịara ha na mberede".
Ọ sị na gọomentị gwara ha na ọ bụ ama a gbaara ha maka ndị omekome chọrọ iji ụzọ aghụghọ bubata ahịa iwu mere ha ji mechie ya bụ okeala.

Ebe foto si, Austin Nwosu
Nwosu sị na ha jụrụ ha ihe ngwaahịa ndị ezigbo mmadụ so ụzọ ahụ ga-eme?
Ndị ọrụ nchekwa ahụ sị ha na-arụ ọrụ gọọmentị dịka e sị zie ha. "na onweghi ihe ha ga-eme".
Ọ sị na ọ rara ahụ i si mba Benin Republic bụbata ngwaahịa ugbua.

O kwuru na ibu ọtụtụ mmadụ bitere ego n'ụlọakụ bụ nke na-amụwabanye ruru naịra iri na asatọ kwa ụbọchị maka ụgbọala bu ibu.
Ọ sịkwa na ndị ekperima na-ezukwa ọtụtụ ngwaahịa ụmụigbo nọ n'ụzọ ebe ahụ.
Nwosu sị na mmechi a emetutachaghị ahịa osikapa maka na ọ bụ ahịa iwu kamgbe.
N'olu ya, "ọ bụghị ụzọ ahụ ka ha na-esi aga".
Mana o kwukwara na ihe mere osikapa ofesi ji aga ahịa bụ maka na nke akọrọ na Naịjirịa ka adala ọnụ.
Nwosu na-arịọ ndị gọọmentị ka ha kawa ahụ mee ka ezigbo ahịa na-abata na Naịjirịa ma 'ghara itufu nwata na mmri e ji saa ya ahụ'.

Ihe nkiri ga-amasị gị











