Gabon Camp: 'Anyị enweghị ọkụ, okporo ụzọ, ụlọọgwụ maọbụ ụlọakwụkwọ kamgbe afọ 1970

Ụmụaka na Ụmụnwaanyị Gabon Camp Enugwu ebe ha na-asa akwa na mmiri Ekulu.
Nkọwa foto, Ụmụaka na Ụmụnwaanyị Gabon Camp Enugwu ebe ha na-asa akwa na mmiri Ekulu

Otu obodo nọ n'Emene Enugwu steeti a kpọrọ "Gabon Community" akwaala arịrị na gọọmentị Enugwu agbahapụla ha n'ihe banyere akụrụngwa eji ebi ndụ.

Ha sị na ha enweghi mmiri ọṅụṅụ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ, ezi okporo ụzọ, ezi ụlọ obibi kama na ha niile bụ ụlọ aja.

Eze na-achịkọta obodo a bụ Igwe John Nomeh gwara BBC na ha si n'Ezza dị n'Ebonyi Steeti bịa biri n'ime ọhịa dị n'azụ ọdụọgbọelu Akanu Ibiam, Enugwu.

O Kwuru na ọ bụ kamgbe afọ 1970 alụchara agha Biafra ka nna ya na ndị ọzọ ya na-akọ ụgbo bịara n'obodo a ịchọ ihe afọ ga-eri ma biri zie ebe a.

Ọ sị na ụlọ dị n'obodo a ugbua ruru otu narị na iri ise, ebe ọnụọgụgụ ndị obodo karịrị otu puku, gụnyere ụmụnwaanyị na ụmụaka.

Mmiri Ekulu Enugwu, ebe a ka ndị Gabon camp na ekute mmiri.
Nkọwa foto, Mmiri Ekulu Enugwu, ebe a ka ndị Gabon camp na ekute mmiri
Nwata nọ na mbara ezi

Igwe Nomeh sị na ihe mere eji a kpọ ha 'Gabon Community' bụ afọ ndị gara aga na ụfọdụ ụmụaka a mụrụ n'obodo gara Panya dị na mba Gabon ịkpata ego.

Mana ha mechara gbara aka lọta nke mere onye ọbụla ji kwekọrịta ịkpọ ebe ahụ 'Gabon Community'.

Gabon Camp

Igwe Nomeh na ndu obodo bụ John Nweke sị na ihe mere ha enweghi ụlọ Simentị bụ na ndị obodo Nike gwara ha ka ha ghara ịrụ ụlọ simentị maka na ha azụghị ala azụ.

Ihe dịka ọgụ afọ gara aga ka ndị agha ụgbọelu Naịjirịa zụrụ ala ma gwa ha ka ha arụla ụlọ simentị na ya.

Ụfọdụ ebe obibi n'obodo a
Nkọwa foto, Ụfọdụ ebe obibi n'obodo a

Onyeisi ndị nche bụ Chinedi Nwaofia rịọrọ gọọmenti Enugwu ka e nye ha ọkụ, mmiri na ụlọọgwu iji chekwaa ndụ ha.

O kwuru na kwa mgbe kwa mgbe ka ụmnwaanyị ha na-anwụ ebe ha na-amụ nwa n'ihi enweghi ụlọọgwụ n'obodo a.

Ụlọụka Katọlik dị n'obodo Gabon, Enugwu Steeti
Nkọwa foto, Ụlọụka Katọlik dị n'obodo Gabon, Enugwu Steeti

Ndị obodo sị na ugbua na ọ bụ naanị mmiri Ekulu ka ha sị enweta mmiri ọṅụṅụ.

Nwaanyị na-akwa akwụkwọ nri
Nkọwa foto, Monica Chima, onye nne ma bụrụkwa onye ọrụ ugbo na Gabon Camp Enugwu

Ihe eji mara 'Gabon Community' bụ ịkọpụta nrị dị iche iche dịka ji, akpụ nakwa akwụkwọ nrị ha na-erisi ndị bi n'Enugwu.

Ụlọ aja
Nkọwa foto, Ụfọdụ ụlọ aja dị n'obodo 'Gabon Community'

Ụfọdụ ndị obodo 'Gabon Community' dịka Nwaofia Chinedu na Monica Chima kwara arịrị sị na gọọmentị na-echeta ha ma oge ntuliaka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ruo.

Igwe John Nomeh, aka na-achịkọta Gabon Camp Enugwu
Nkọwa foto, Igwe John Nomeh, aka na-achịkọta Gabon Camp Enugwu
Mbara ezi

Mana ngwa ngwa nke a ga-achara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a na-echefu ha na-eleghi anya n'azụ.

Ime obdodo 'Gabon Community'
Nkọwa foto, Ime obdodo 'Gabon Community'

Igwe Nomeh kwuru na ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị ọbịa n'Enugwu mana ọ rịọrọ ka gọọmentị biko nye ha ọkụ Latrik, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na mmiri ọṅụṅụ.

Ọ gara n'ihu rịọ ka gọọmentị Enugwu Steeti nyere ha aka n'okwu banyere ịnapụ ha ala ma gbatara ha ọsọ enyemaka site n'izi ha ebe ọzọ ha ga azụ ala biri.

Ụlọ aja na Gabon Community
Ukwu osisi
Oke agbara agba
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị