Enugwu ga-enweta ụgbọelu agha maka nchekwa ọwụwa anyanwụ

Ụgboelu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naịjirịa gotere ụgbọelu atọ tinyere na iri na ise dịbu adị

Onye ọchịagha elu Naịjirịa bụ Sadiq Abubakar ga-ezigara ụgbọelu anọ e ji alụ agha maka nchekwa ọwụwa anyanwụ.

Ọ gara Enugwu ịtọ ntọala maka ụlọ nkuzi ndị agha elu na-arụ na steeti ahụ.

O kwuru na isi ụlọakwụkwọ ndị agha elu ahụ n'Enugwu bụ iji kwado ndị agha elu maka agha Boko Haram.

Abubakar kwuru na ya bụ ụlọakwụkwọ ga-enye aka n'ọrụ nchekwa na Naịjirịa niile ebe o kwuru na ya bụ ndị agha ga-ebido iwe ihe ruru mmadụ otu puku na narị ise n'ọrụ n'ọnwa isii niile.

Aka na-achị Enugwu steeti tokwara Abubakar maka ya bụ ụlọakwụkwọ ọ na-ewuli n'Enugwu ma kwee nkwa inyere ha n'ụzọ niile ọ nwereike ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ