Ego a na-atụ n'Imo agaghị aba akpa anyị - Okwuchite ọnụ Rochas

Ebe foto si, Getty Images
Ka akụkọ na-akọwa na gọọmentị Imo steeti agwala ndị okenye niile tozuru ị rụ-ọrụ ha kwụọ naira puku atọ pụtara, gọọmentị Imo na-akọwa na ọ gbụghị ha ka ego a dị mkpa.
Ebere Iwuji bụ onye na-ekwuchite ọnụ gọvanọ n'ihe gbasara mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ụgwọ a bụ ụgwọ a ga-akwụ nanị otu mgbe. O kwukwara na a ga-eji ego kwado ọrụ dị icheiche obodo ndị nọ n'ime Imo steeti ji aka ha na-eme.
Agbanyeghị na akụkọ na-ekwu na ọ nde naira isii ka eyiri otu obodo, Nzewuji sịrị na enweghị aha ego ọbụla akpọrọ, makana ọ ndị bi na imi obodo ugbua kwesịrị ịtụ ụtụ a.
Nzewuji si "Ego a gaghị abanye n'akpa gọọmentị Imo steeti, ọ bụ ngalaba obodo dị icheiche akporọ Community Government Council (CGC) nwe ya".
Nzewuji gara n'ihu kwuo na gọọmentị Imo steetị ga-eji nde naira iri wee kwado obodo ọbula tụrụ ego a, ka ha na-ele anya na a ga-eje ya hiba ụlọọrụ mepụta ihe na ihe ndị ọzọ obodo chọrọ.
"A nam eche na onye ọbụla chọrọ ọganiru ga-achọ ikwado ya, okachasị ebe ha na-etinye aka n'mbu na ọrụ mmepe obodo," Nzewuji kwuru.
Nzewuji gakwara n'ihu kọwa na onweghị eze obodo ọbụla anapụrụ ọgwọ onwa maka ihe a.
Gee nkọwa ya n'uju ebe a:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:










