Akụkọ kachasi n'abalị a: Buhari bụ nna Naijiria - Adesina
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a

Ebe foto si, AFP
"Buhari bụ nna Naịjịrịa" - Adesina
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla akụkọ na-agagharị na Buhari kọrọ ụmụ ntorobịa Naịjirịa ọnụ.
Akwụkwọ Femi Adesina dere kwuru na Buhari bụ nna Naịjirịa niile enweghi ike ịkọ ụmụ ntorobịa Naịjirịa ọnụ mana ọ bụ ndị agamevu tụụharịrị ihe o kwuru.
Ebe ọzọ na Naijiria
Gọọmenti Kaduna steeti akatọọla akụkọ na-agagharị na ha chụrụ ụfọdụ nime ndị nkuzi e were ọrụ ọhụrụ na steeti ahụ.
Akụkọ pụtara na steeti ahụ chụrụ ndị nkuzi ọhụrụ ruru mmadụ puku ato maka na ha etozughi n'ọrụ mana gọọmenti steeti ahụ kwuru na ndị nkuzi ọhụrụ ahụ ga-ebido ọrụ n'oge na-adịghị anya.

Ebe foto si, @GovKaduna
Ndị eze abụọ na-eme ihe eji kpọọ ha eze

Ebe foto si, Getty Images
Eze nwaanyị mba Britain ekwuola na obi ga -adị ya ụtọ ma nwa ya bu nwaeze Charles rigo ọkwa ọchịụchị ndị otu Commonwealth.
Ebe Eze ndị mba Swaziland gbanwere aha obodo ha na mmemme emere maka ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. Aha ọ hụrụ ya bụ zị "Kingdom of eSwatini"
Na akụkọ egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọgbaa bọọlụ ootu Chelsea Marcos Alonso agaghị esonye na ọkara ịkpeazụ nke asọmpị iko FA n'ụbọchị Sunday.
Nke a mere ebe FA machiri ya maka ọgụ ya na Shane Long lụrụ n'ụbọchị Satọday gara aga.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa











