Na foto: Izrel n'afọ 70 - ihe asaa pụrụiche mere

Ihe asaa pụrụiche mere na ndụ ndị mba Israel, dịka ha na-agba afọ 70.

Ndị Juru na-aṅụrị maka nwereonwe ha ụbọchị 14 ọnwa Mee afọ 1948 na Tel Aviv

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Izael na-agba afọ 70, dịka akwụkwọ ọnwa ndị Hibru si kwuo kamgbe ha nwetaara nwereonwe. Ụbọchị 14 ọnwa Mee afọ 1948, dịka akwụkwọ ọnwa Gregorian bụrụ ụbọchị oke ọṅụ nye ndị Ju nọ n'ụwa niile nke bịara afọ atọ ka agha a kpọrọ Holokọstụ mesiri. Mba ndị Arab ndị ọzọ nọ ha nsọ ekwenyeghi dịka ha katọrọ mba ọhụụ ahụ ka chi ya foro.
Ụmụaka Palestaịn nọ n'Izrel eche otu UN ga-agwa ha maka ọdịnaihu ha oge ekewapụtasịrị mba Izrel, 1949

Ebe foto si, Keystone / Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị Palestin ruru narị puku si na be ha gbafuo maọbụ a chụpụ ha n'agha soro nwereonwe mba Israel, nke a bidoro nsogbu ndị mbịambịa nke mba Palestin nke na-eme rue ugbua. Ihe ruru mmadụ puku 600 bụ ndị mbịambịa ndị Ju si na mba ndị Arab na ihe ruru mmadụ puku 250 bụ ndị ndụ fọrọ ka alụsịrị agha Holokosụtụ bi na Yurope guzobere n'Izrel n'afọ ole na ole na mbido mba ahụ nke mere ọnụọgụgụ ha jiri ria elu ugbo abụọ karịọ́ ọnụọgụgụ ndị Juu nọbụ ya.
Onye omekome agha Karl Adolf Eichmann (1906 - 1962) n'ụlọikpe na Jerusalem

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ 1961, Izrel bidoro ikpe otu onyeisi ndị ọchịchị Nazi bụ Adolf Eichmann na Jerusalem. Eichmann bụ onye malitere ya bụ agha Holokọsụtụ. Ndị ọrụ ya jidere ya n'Ajentina wee mịpụ ya na mba. Ọtụtụ izu, ndị Izrel nọ n'ụjọ ama ndị fọrọ ndụ na-agba megide Eichmann n'ụlọikpe. A mara ya ikpe ọnwụ ma kwụgbuo ya n'afọ 1962.
Ụmụ Izrel na-ele mgbidi Westan ahụ oge e weghachietere ya n'ụbọchị nke isii agha ahụ n'afọ 1967.

Ebe foto si, David Rubinger / Getty Images

Nkọwa foto, Agha a lụrụ mkpụrụ ụbọchị isii n'afọ 1967 gbanwere ọtụtụ ihe na mpaghara Midulu Isti. Izrel busoro mba Egypt agha na-erughi eru nke onye ndu ya mara aka ikpochapụ mba ndị Juu ahụ. Ọgbaghara nke ya na Egypt, Jodan na Siria biri ebe Izrel nọchiri mpaghara a na-akpọ Sịnaị Penịnsula nke bụ Gaza, Ọwụwa anyanwụ Jerusalem, akụkụ Westi Banki na elu Golan. Ha wekwara mgbidi a na-akpọ Westan Wallu nke dị na Jerusalem otu ebe ndị Juda na-ahụ ka ebe nsọ bara n'aka ndị Juu kamgbe afọ pukua abụọ.
Onye Izrel e ji ka a na-ekele oge ha latara ka a gbapụasịrị ha site n'Entebbe ụbọchị 3 ọnwa 1976

Ebe foto si, Keystone

Nkọwa foto, Otu ihe pụrụiche mere n'Izrel n'afọ 1976 oge ndị akpụobi malitere ọrụ iji chọta ndị e ji eji ruru mmadụ otu narị bụ ọkachasị ndị Izrel maọbụ ndị Juu nke ndị Palestinain maọbụ ndị nkwado ha ji na ọdọụgbọelu Entebe na Yuganda. jiri ụgbọelu bulaa ndị ha kpọpụtara Izrel. Onyeisi ndị akpụobi ahụ bụ Yoni Netanyahu bụ nwanne onye bụ onyeisi mba Izrel ugbua mana e gburu ya n'ọrụ mgbapụa ahụ.
Onyeisi mba Amerịka Bill CLinton (n'etiti) ọ na n'etiti onyeisi PLO Yasser Arafat (nọ n'aka nri) na onyeisi mba Izrel bụ Yitzhak Rabin, dịka ha na-ekwe n'aka.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otu ihe mere pụrụiche bụ oge ndị iro abụọ bụ onyeisi mba Izre bụ Yitzhak Rabin na onye ndu otu PLO nke ndị Palistain bụ Yasser Arafat kwere n'aka, nke mepere ụzọ okwukwe na olileanya na ọgbataughie dị n'etiti mba abụọ ahụ ga-ebi. N'ọnwa Sepụtemụba afọ 1993, dịka ọtụtụ izu a na-akpa nkata na nzuzo gasịrị, ha binyere aka n'akwụkwọ udo nke oge ahụ n'ụlọ ọcha ndị ma Amerịka n'ihu onyeisiala mba Amerịka oge ahụ bụ Bill Clinton.
Ndị agha mba Izrel bụ akpatịozu onyeisiala ha bụ Yitzhak Rabin bụ onye e gburu egbu na-apụta na ụlọomeiwu Knesset dị na Jerusalem ụbọchị 5 ọnwa Novemba afọ 1995

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ka afọ abụọ gasịrị, otu ndị Juu na-ekwenyeghi n'udo ahụ e kpere gburu Rabin ebe ọ na-eme mgbasaozi na Tel Aviv. Ọnwụ ya tụrụ ndị Izrel niile n'anya ebe ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ụwa niile gara akwamozu ya, nke gosiri na ọ bụ onye a na-asọpụrụ n'ụwa niile.