Creflo Dollar: Ịkwụ 'Tithe' adịghị na 'New Testament'

Ebe foto si, Crefflo Dollar/Instagram
Otu ụkọchukwu a ma ama na mba Amerịka nakwa ụwa niile bụ Creflo Dollar ekwuola okwu dara gbawai ebe niile.
Na nkuzi okwuchukwu o nyere n'izu gara aga, ọ mere ntụgharị gbasara ihe niile o kuziburu maka onyinyo otu ụzọ n'ụzọ iri a kpọrọ 'Tithe' na Bekee.
Ọ kọwara na atụmatụ inye otu ụzọ n'ụzọ iri bụ ihe dị na naanị ọkara mbụ n'akwụkwọ nsọ na-akọ akụkọ mere tupu Kraịst a bịa.
"Atụmatụ a bụ nke enyere n'okpuru iwu (iwu Moses)" ka o kwuru.
Mana Kraịst bịara mezuo iwu ahụ niile mgbe ọ nwụrụ n'obe ma kwuo na o nweghi ebe ọbụla enyere onye ọbụla ịkwụ otu ụzọ n'ụzọ iri mgbe Kraist bilichara n'ọnwụ.
Kama o kwuru maka 'Onyinye', ya bụ inye onyinye site n'etu ụgwọ ọnwa gị ha bụ ihe enyere n'ọkara abụọ n'akwụkwọ nsọ.
Okwu a ụkọchukwu Dollar kwuru maka inye otu ụzọ n'ụzọ iri bụ nke mụnyere ọkụ na soshal midia mgbe o malitere iwu.
Ọtụtụ ndị mmadụ gosiri nkwenye n'okwu ya dịka Uti Nwachukwu na-eme ihe onyonyo, ọ sị na o teela aka ọ na-agwa ndị mmadụ okwu maka ịkwụ otu ụzọ n'ụzọ iri.
Ọ sị "okwu a emeela m ka m kwụsị ịtụ ụkwụ n'ụlọụka ọbụla na Naịjirịa kemgbe afọ 2018"
N'agbanyeghi nke a, ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ Dollar na-ekwu na ọ na-atụgharị okwu Chineke.
Ihe mere ndị Naịjịria ji enye otu ụzọ n'ụzọ iri

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị Naịjiria so n'otu kraist kwetere na ọ bụ iwu inye otu ụzọ n'ụzọ iri n'ụlọ ụka.
Mana Yemisi Adegoke dere na ndị mmadụ na-ekwu na ya bụ onyinye otu ụzọ n'ụzọ iri pụtara na ndị ogbenye na-akwụ ụgwọ ndụ mmefusi ego ndị ọgaranya na-ebi na Naịjịria dịka ndị ụkọchukwu.
"Onye ọbụla na anaghị akwụ otu ụzọ n'ụzọ iri agaghị aga eligwe, kpomkwem." Ụkọchukwu Enoch Adeboye gwara ndị ụkọchukwu na Legọs na mbido ọnwa.
"Laghachị nụ, ma emecha nzụkọ a ka ụnụ kwụpụta ma dozie ụzọ unu na ndị unu na-edu." O tiri nke a n'iwu nye ha na Ridemshon Kampụ.

Ebe foto si, Alamy
Ụkọchukwu Adeboye ekwubuola maka ya bụ onyinye ọtụtụ mgbe."Ị kwụ otu ụzọ n'ụzọ iri abụghị ihe a na-elechapụrụ anya."
Ọyọkwara ka ha gaa lee akwụkwọ ozi Malachị nke atọ site n'amaokwu nke asato ruo iri na otu.
N'agba ọhụrụ ntụgharị akwụkwọ nsọ ebe ahụ dị n'akwụkwọ nsọ kwuru na: "Abum Chukwu onye kachasị ike, a na m a gwa gi ka i nwaa m. Weta otu ụzọ n'ụzọ iri n'ụlọ ndokwa m, ka nri wee juputa n'ụlọ nsọ m. Mgbe ahụ ka m ga -emepe ụzọ eligwe wedata ngọzị zuru oke.''
Ntụgharị ndị ọzọ kpọrọ ya tait nke pụtara otu ụzọ n'ụzọ iri.
Ndị Naịjirịa na-adọgha isiokwu a na soshal midia.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ụfọdụ ndị nkatọ na-ekwu na ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-eti iwu ka ndị otu ha na-enye otu ụzọ n'ụzọ iri kpatara nnukwu akụ na ụba.
Ebe e nwere ọkara nde 180 ndị Naijiria kwenyere na kraist, o gosiri na akụ na ụba ụlọ ụka ga-akarịakarị.
Ụkọchukwu Adeboye n'onwe ya ka edebara aha ya n'akwụkwọ Forbes dika ụkọchukwu kacha nwe ego na mba ụwa niile n'ogoogo nde dọla 130.
'Nkụzị aghụghọ'
Otu onye a ma ama dịka onye na-akatọ otu ụzọ n'ụzọ iri ma bụrụkwa onye na-eme mgbasaozi n'igwe redio akpọrọ 'Daddy Freeze' kwuru na ihe na-ewe ya iwe bụ na ndị ụkọchukwu na-agwa ndị ha na-edu bụ ndị ogbenye na ha na-enye ụlọ ụka ego, Chukwu ga-eme ha ọgaranya.
N'ọnụ ya, "ndi ọdịka ha na-abawanye na akụ na ụba bụ ndị ụkọchukwu na-agbasa ozioma akụ na ụba.''

"Kedu ka ị ga-esi nwee ụkọchukwu ga-esite na ego onyinye na otu ụzọ n'ụzọ iri ndị ha na-edu were rụcha ụlọakwụkwọ ma ọ garara ndị ndu ha ọnụ ịkpọta ụmụ ha.
Aha onye mgbasa ozi bụ Ifedayo Olarinde na-akwu otu ụzọ n'ụzọ iri ma kwenye n'ụzọ kraist mana o kwetere na otu ụzọ n'ụzọ iri bụ ihe agba ochie na adịghịzị mkpa.
"Ọ bụ nkụzi aghụghọ nke na-etinye ndị mmadụ n'agbụ.''
Ihe nkwụpụta a buterela Daddy Freeze
Ndị ụkọchukwu akatọọla ihe o na-ekwu nakwa ndị ụfọdụ mmadụ na-agbara ya ọsọ.
"Onweghị onye chọrọ ka m rụọrọ ya ọrụ', o kwuru.
Mana e kwetere m na ihe m na-eme, a na m emere ya ndị mmadụ ka ha si n'agbụ pụọ.
Ọ bụ naani onye otu Kraist na-adogha ihe gbasara isiokwu a.
Ụfọdụ ndị ụkọchukwu a ma ama ekwuola na ọbụghị iwu.
Irụ ọrụ Chukwu
Idris Bello-Osagie, ụkọchukwu na church di na Legọs kwuru na isiokwu a dịmkpa na-ebe ndị otu Kraist nọ mana o kwukwara na ekwesighị ị ma ya ka iwu.
O kwukwara na ọhiara ahụ ị hụ onye na-eso ụzọ Kraist ghara i na-enye onyinye.

"N'obodo dika Naijirịa na-enweghi ọtụtụ ihe e ji atụ ndụ mmanụ, ọ bụ ụlọ ụka na-eweputa ego ha were ya gboro ndị na-enweghị ike nyere onwe ha aka.
Ọ sị kwa na-eji ego agbasa ozioma nke Kraist.
Ndị oje ụka m zutere na Legọs kwuru na obi dị ha mma ịdị na-akwụ otu ụzọ n'ụzọ iri.
Ụfọdụ sị na ha ga na-eme ya maka na ọ na-abara ha uru.
Ebe ufọdụ dika Temitope Olagbegi kwuru na ndụ imefusi ego ndị ụkọchukwu diri Chukwu.
N'agbanyeghị ndụ imefusi ego ndị ụkọchukwu akwụsịghị ndị otu Kraist inye onyinye a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









