Inflation Drop: Ọnụahịa ihe nri gbaturu n'ọnwa Julaị karịa nke ọnwa June

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Mkpụrụ osisi ụfọdụ a na-atụbata

Ọnụ ahịa nrị nakwa ihe ndị ọzọ gbaturu n'ọnwa Julaị karịa ka ha dị n'ọnwa June dịka ngalaba 'Nigeria Bureau of Statistics' siri kwuo.

NBS kwuru na ọnụahịa ihe nrị n'ọnwa Julaị dị pasenti 1.26, ebe nke ọnwa Juun dị pasentị 1.36.

Aha onyonyo, Ihe mgbada ọnụ ahịa pụtara ụmụ Naijiri- Ọkachamara akụnaụba

Chetakwa na BBC Igbo bara n'ime ahịa n'ọnwa gara aga ebe ndị ahịa kwuru na n'ezie ọnụ ahịa nri dị ala karịa ka ha dị na mbụ.

Aha onyonyo, Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie?

Ikpe dị n'etiti Naijiria na P&ID

Gavel

Ebe foto si, Getty Images

Otu ọkaikpe na mba Ingland enyela otu ụlọọrụ aha ya bụ P&ID ikike ịchọ ụzọ ha ga-esi nara gọọmentị Naijiria ihe ruru ijeri dọla itoolu maka inupu isi na nkwekọrịta gbasara mmepụta ikuku gaasị.

Ụlọọrụ ahụ kwuru na gọọmentị Naijiria laghachiri azụ na nkwekọrịta ha nwere maka ịrụ ebe a na-emepụta ikuku gaasị na Kalaba.

Trump chọrọ ịzụ Greenlad

Greenland

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Greenland bụ obodo dị na mpaghara Denmark mana ha anọghị n'okpuru ochịchị ya.

Na mba ofesi, mba Greenland agwala onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na ha anaghị ere obodo ha ere kama na ha ga-anabata onye ọbụla chọrọ iso ha zụkọọ ahịa.

Akụkọ kwuru na Trump ekwuputala mmasị ya ka Amerịka zụrụ obodo Greenland.

Fifa enyela Siasia ọsọ

Samson Siasia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011

N'egwuregwu, Fifa enyela Samson Siasia ọsọ ụwa ebighiebi n'egwuregwu bọọlụ ma dakwaa ya nha mara abụba maka nrụrụaka.

Kọmịtị Fifa na-ahụ maka agwa ziri ezi kwuru na ikpe mara Siasia n'ebubo ịna akaazụ iji nwogharịa ụfọdụ asọmpi.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ