Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie?

Lee ihe nkiri maka ọnụahị ihe nri

Aha onyonyo, Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie?

Ndị ọkammụta na-agbagha ihe NBS kwuru maka nkwupụta ngalaba na-ahụ maka ngụkọ na Naijiria nke a kpọrọ 'National Bureau of Statistics'(NBS) nke kwuru na ọnụ ahịa adaala karịa etu ọdị n'ọnwa ole gara aga.

NBS kwuru na nsonso na ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa(inflation) agbatuola karịa ka ọ dị n'ọnwa gara aga dịka o jiri 0.18 pasent daa rue 11.22 site na 11.40 pasent ọ bụbu.

Mana ụfọdụ ndị ọkachammara n'okwu akụnaụba kwuru na okwu ahụ adabeghị.

Ọma ahịa
Nkọwa foto, Ọnụ ahịa adaala n'ezie

Ha kwuru na ka ọ dị ugbua, na Naijiria enweghị akụnaụba ọbụla ma ya fọkwa nke na-aga n'ihu.

Ha na-ajụ ajụjụ ebe NBS siri nweta ozi(data) ha gbadoro ụkwụ were nwee mkpebi ha.

Ahịa
Nkọwa foto, Ndị aha kwuru n'ọnụ ihe oriri adaala n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria

Mana ụfọdụ na-ekwu na ya bụ ozi si n'aka NBS kwụ ọtọ ka sịga.

Ndị ahịa BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru n'ọnụ ahịa ji, garị , akịdị na agwa adaala karịa ole e rere ya n'oge a n'afọ gara aga.

Ihe nrị na-ada n'afọ 2018 na ugbua
Nkọwa foto, Ọnụ ahịa nrị na-ada ugbua adaala karia ihe ọ dara n'n'afọ 2018

Ọkammụta n'ihe gbasara akụnaba bụ Boniface Chizea gwara BBC n'ezie n'ihe ọnụahịa na-ada gbadara.

Chizea gara n'ihu gbaa ama na ọ ga-ewe oge tupu ọ pụta ihe.

Aha onyonyo, Ihe mgbada ọnụ ahịa pụtara ụmụ Naijiri- Ọkachamara akụnaụba

Ọ kọwara na ihe ozi NBS wepụtara pụtara bụ "na ego ndị mmadụ nwetara ha ga-eji ya zụta ihe karịa ka ọ dị na mbụ."

Ahía

Chizea kwusiri ike na NBS tozuru etozuu na iwepụta ozi kwesiri ntụkwasi obi ma rụtụ aka na oge Naijiria nwere 'recession' na ha gbara ya bụ nsogbu n'anwụ.

Akụkọ ga-amasị gị: