Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie?
Lee ihe nkiri maka ọnụahị ihe nri
Ndị ọkammụta na-agbagha ihe NBS kwuru maka nkwupụta ngalaba na-ahụ maka ngụkọ na Naijiria nke a kpọrọ 'National Bureau of Statistics'(NBS) nke kwuru na ọnụ ahịa adaala karịa etu ọdị n'ọnwa ole gara aga.
NBS kwuru na nsonso na ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa(inflation) agbatuola karịa ka ọ dị n'ọnwa gara aga dịka o jiri 0.18 pasent daa rue 11.22 site na 11.40 pasent ọ bụbu.
Mana ụfọdụ ndị ọkachammara n'okwu akụnaụba kwuru na okwu ahụ adabeghị.

Ha kwuru na ka ọ dị ugbua, na Naijiria enweghị akụnaụba ọbụla ma ya fọkwa nke na-aga n'ihu.
Ha na-ajụ ajụjụ ebe NBS siri nweta ozi(data) ha gbadoro ụkwụ were nwee mkpebi ha.

Mana ụfọdụ na-ekwu na ya bụ ozi si n'aka NBS kwụ ọtọ ka sịga.
Ndị ahịa BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru n'ọnụ ahịa ji, garị , akịdị na agwa adaala karịa ole e rere ya n'oge a n'afọ gara aga.

Ọkammụta n'ihe gbasara akụnaba bụ Boniface Chizea gwara BBC n'ezie n'ihe ọnụahịa na-ada gbadara.
Chizea gara n'ihu gbaa ama na ọ ga-ewe oge tupu ọ pụta ihe.
Ọ kọwara na ihe ozi NBS wepụtara pụtara bụ "na ego ndị mmadụ nwetara ha ga-eji ya zụta ihe karịa ka ọ dị na mbụ."

Chizea kwusiri ike na NBS tozuru etozuu na iwepụta ozi kwesiri ntụkwasi obi ma rụtụ aka na oge Naijiria nwere 'recession' na ha gbara ya bụ nsogbu n'anwụ.











