Minimum Wage: Anyị ga-akwụ N27,000 dịka ụgwọ opekatampe - Ndị Gọvanọ

Ebe foto si, Speaker's Media Office
Otu jikọrọ ndị Gọvanọ na Naijiria ekwetala na ha ga-akwụ puku naịra iri abụọ na asaa dịka ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ.
Onyeisioche otu a ma bụrụkwa Gọvanọ nke steeti Zamfara bụ Abdulaziz Yari, kwuputara nke a n'ọgbakọ nke ọhanaeze ndị omeiwu etiti nke nta hiwere n'Abuja n'ụbọchị Mọnde, Jenụwarị 28, 2019.
Ọ kọwara na ha mere mkpebi a na nkwekọrịta nye ihe otu nzukọ Council of state kwupụtara na nso a.
Gọvanọ Yari rịọziri ka enwee mmegharị nye usoro eji eke ego Naijiria kwa ọnwa, ma rụtụ aka n'usoro dị ugbua bụ nke na-enye ndị Gọvanọ steeti dị iche iche nsogbu.

Ebe foto si, Speaker’s Media Office
Na ntụnye ya, minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige gara n'ihu kọwaa na N27,000 bụ ụgwọ ọnwa opekatampe nke ọchịchị etiti nabatara maka ndịọrụ niile na Naijiria.
O kwuru na ọchịchị steeti dị iche iche maọbụ otu ọrụ ndị mmadụ nwe, nwekwara ike ịkpọnye aka n'ihe o nwere ike ịkwụ bụ nke na-agaghị adị nta karịa N27,000.
Ngige kọwakwara na ọchịchị etiti ehiwela otu ndụmọdụ ga-enyere ya aka ịkwụ ndịọrụ ya N30,000 dịka ụgwọ opekatampe ma hapụ ịchụ onye ọrụ ọbụla.
Okwu Onnoghen ka dị ọkụ:
Ụlọikpe na-ahụ maka mpụ n'ọrụ gọọmentị akpọrọ Code of Conduct Tribunal, eyigharịala ikpe ọkpaikpe Walter Onnoghen gawa n'ọdịnihu.
Ụlọikpe CCT kwuru na ọ bụ iwu ụlọikpe mkpegharị nyere mere ha ji yigharịa ya.
N'akụkọ dị ka ibe ya,
Ọtụtụ ndị ọkaiwu na-eme ngagharị iwe n'Abuja maka mwepụ Onyeisiala Buhari wepụru Onnoghen.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Ndị nkịtị sonyekwara na ya bụ ngagharị iwe n'Abuja na Legọs. N'ime ndị a bụ ndi na-akwado ihe onyeisiala mere nakwa ndị ji atụmatu #OccupyNigeria asị na ihe a jọgbụru udele sigbuo nkakwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Eyigharịala asọmpi Iko Mba Afrịka
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu na mpaghara Afrịka bụ CAF eyigharịala oge a ga-agba asọmpi Iko mba Afrịka makana ha chọrọ ka ndị na-agba bọọlụ nweta ohere izu ike ma e mechaa emume Ramadan.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ya bụ asọmpi ga-ebidozi n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun ruo ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị, kama ụbọchị iri na ise ọnwa Juun ruo ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Julai eyiburu ya.
Onnoghen ga-aga ụlọikpe

Ebe foto si, National Judicial Council
Okaikpe ukwu nke Naịjirịa bụ Walter Onnoghen ga-aga ụlọikpe maka nwepụ onyeisiala Muhammadu Buhari nwepụrụ ya n'ọrụ taa bụ Monde.
Otu n'ime ndị okaiwu na-ekwuchitere Onnoghen ọnụ ya kwuru na nke a dị mkpa maka na ụzọ esi sepụ ya bụ nwaamadị ọnụ n'ara ezighị ezi.
Ngige akatọọla Ohaneze Ndigbo

Ebe foto si, @LabourMinNG
Minista na ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola n'Ohaneze echemighị echiche were mee ndọnye ukwu bụ nke ha meere Atiku Abukakar nke PDP.
N'otu aka ahụ Anambra steeti kwuru na ọnwebeghị ndị Ohaneze Ndigbo dọnyere ukwu meriri na ntuliaka ọbụla.
Onyeisiala Buhari akpọọla ndị Omeiwu APC ọgbakọ

Ebe foto si, @NGRSenate
Ka a na-ekwu ka a na-ekwu o, Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọọla ndị omeiwu nọ na pati APC ọgbakọ mberede taa bụ Monde n'obi ya n'Abuja.
Akụkọ na-ekwu na oku mberede a bụ ka ndị otu pati ha nọ na Sinete were nwee ike ịkwado onwe ha maka nkatọ so nwepụ ahụ enwepụrụ Onnoghen n'ike.
Aga eme tụmbọm tụmbọm AFCON na Apreelu

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, Super Eagles nke Naịjirịa ga-amata ndị ha na ha ga-asompi African Cup of Nations na ọnwa Eprelu.
An Kaịrọ, isi obodo Ijipt ka a ga-eme tụmbọm tụmbụm aga eji họpụta ndị ga-agba ibe ha bụ nke otu egwu bọọlụ iri abụọ na anọ (24) ga-eso na ya.
Akwa ọdọmmiri ezeela na Brazil

Ebe foto si, Getty Images
A na-achọ ihe dịka mmadụ 300 achọ na Brazil kemgbe akwa ọdọmmiri zerechere na mba ahụ na Fraịde.
Ihe ruru mmadụ 58 anwụọla ụbọchị ụka na ya bụ ọdachi dara n'akụkụ Brumadinho.
ASUU sị gọọmenti etiti arafuzila ndị mmadụ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisioche Academic Staff Union of University (ASUU) adọọla aka na nti ka gọọmenti etiti kpachara anya maka iduhie ndị mmadụ ụzọ maka ego ha sị na ha kwụnyere ndị ASUU.
Ọkammụta Biodun Ogunyemi kwụrụ na abụbụ ọrụ ha na-agba ka na-aga n'ihu mana ihe ji ya bụ nwa ihe ole maọbụ ole fọrọ ka ha kapịa ya bụ okwu ọnụ.