2019 Election: Ndị ndọrọndọrọ anọghị n'ọchịchị chọrọ ibute ọgbaghara na ntụliaka - Lai Mohammed
Akụkọ dị mkpa

Ebe foto si, Getty Images
Onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala bụ Lai Mohammed, e kpugheela ihe ọkawara dịka nkata ọjọọ ndị ndọrọndọrọ na-anọghị n'ọchịchị na-akpa iji kụnyere ntụliaka nke ọnwa Febụwarị 2019 ụkwụ.
N'ozi o zipụrụ ụbọchị Monde, Mohammed kwuru na ọchịchị etiti enwetala ozi na ndị a na-anọghị n'ọchịchị chọrọ ibute ọgbaghara iji kposaa ntụliaka ahụ na-abịa abịa, ma nye ohere ka enwee ọchịchị nchere oge.
O kwuru na ha enwetakwala ozi na ndị a akpọtụrụla otu Boko Haram, ndị ojiegbe ezu nakwa ndị agha egoro ego si mba Niger, iji buo agha megide ndị nọ na ọchịchị, nakwa steeti dị iche iche gụnyere Adamawa, Bauchi, Borno, Benue, Kano, Kaduna, Nassarawa, Plateau, Taraba nakwa steeti Zamfara.
Onye Minista a nyere mmasịobi ike na ọchịchị etiti na-agbasi mbọ ike iji kụgharịa ajọ ọnọdụ a, ma mee ka enwee ntụliaka nke afọ 2019 bụ ịgba.
Ọ rịọziri ndị Naijiria ka ha mụrụ anya ka azụ na ụbọchị ndị na-abịa abịa, ma gbakwụnye na ụlọọrụ ndị nọ n'okpuru ụlọọrụ ya ga-arụ ọrụ iji hụ na-agwara ndị Naijiria ka o si akpọtụ gbasara ntụliaka na-abịa.
OBJ sị na APC na-anabta ndị ohi

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasajo na mkparịta ụka ya na BBC nwere sị onye ọbụla nwere ike izugbu Naijirịa n'ohi ma ọ nweghị ihe a ga-eme ya ma ị nọrọ na pati APC.
Chebiri akụkọ a n'uju na elekere isii ụtụtụ echi.
Lai Mohammed na-ahụ ọgbaagha na 2019

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru gọọmenti etiti bụ Laị Mohammed oboro ndị pati na anọghị n'ọchịchị ebubo mgbaokpuru maka ịbute ọgbaaghara na ntuilaka 2019.
WhatsApp ebeletala ikesa akụkọ

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, Ọba nzikọrịta ozi Whatsapp ekpebiela ịbelata mmadụ ole ị nwere ike ịgbasara ozi otu mgbe dịka onyeisi ha siri kwuo na Jakarta, Indonesia.
Ụlọọrụ a mere nke a iji belata akụkọ ụgha eji ya bụ ọba nzizọrịta ozi agbasa bụ nke eboro na ọ tara isi mmadụ ole ma ole mgbe gara aga.
Mmadụ atọ n'otu ezinaụlọ agaala mkpọrọ otu mgbe

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, akuko na-eru anyi ntị sị na atụrụ ụmụnwaanne atọ si ezinaụlọ Sodje eji
egwuruegwu mara mkpọrọ maka ịkpabiri ego n'akpa ego ụlọọrụ ha guzobere iji enyere ndị ụwa na-ara ahụ aka.
Atụrụ ụmụ Naịjirịa a bụ Efe, Stephen na Bright Sodje mkpọrọ kemgbe afọ 2017, mana ọ bụ ugbua ka iwu kwere ka agbasaa ozi ya.
Gee Nkeji anyị ebe a
F-SARS apụọla
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na onyeisi ndị uweojii ọhụrụ bụ Adamu Abubakar enyela iwu ka e kpochapụ ngalaba ndị uweojii a na-akpọ F-SARS n'ịchafụ.
Onye na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari ọnụ n'ihe gbasara soshal midia bụ Bashir Ahmad depụara nke a n'akara Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana, BBC Hausa na-akọwa na mkpochapụ metụtara sọsọ ebe ọrụ F-SARS dịka ngalaba dị n'aka gọọmentị Naịjirịa.
Ihe atumatu a pụtara bu na F-SARS alagachiela ịbụ SARS, ma ị nọkwa n'okpuru aka na-achi ndi uweojii na steeti dị iche iche.
Buhari asaala Obasanjo

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Muhammadu Buhari asaala onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo.
N'ọsịsa ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu binyere aka, gọọmentị etiti sị na Obasanjo na-eme anya ụfụfụ makana Buahri ka nwe ugwu.
Ha gara n'ihu kwuo na eziokwu adịghị n'ebubo niile Obasanjo boro Buhari na APC banyere ntuliaka n'abịa.
ASUU ekwuola ebimnobi ha banyere abụbụ ọrụ ha

Ebe foto si, iStock
Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị nkụzị mahadum bụ ASUU enyela gọọmentị etiti atụmatụ ha ga-eji laghachi ọrụ.
Biodun Ogunyemi bụ onyeisi ASUU sị na ha ga-akagbu abụbụ ọrụ bidoro kamgbe afọ 2018 ma ọ bụrụ na gọọmentị kwụọ ha ijeri naira narị abụọ na iri abụọ (220 billion).
Aka uweojii ji ndị na-ere nri nwa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na mba Australia awụchiela mmadụ ise ha sị aka ha dị na nrụrụaka metutara ire nri nwa na China.
Nrị nwa kwa?
Eziokwu, China bụ mba ebe ntụbata nrị nwa bụ ahịa ukwu na-enye ego. Nke a bụ maka ujo nri nwa adigboroja.
Rangers agaala ihu n'iko CAF

Ebe foto si, Twitter/RangersIntFC
Otu Rangers International nke Enugwu jị ọkpụ goolu abụọ asatara otu sị Bantu FC nke mba Lesotho gaa nke ọma n'asọmpị CAF Confedration cup
Mmeri a nyere Rangers ohere ịga n'ihụ na-agba ọzo n'asọmpi a.
Gee nkeji a ebe a:
Lee ihe nkiri nke taa:











