Minimum wage: Ọ ga-ebute 'inflation'?

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ọtụtụ ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba obodo - bụ ndị Bekee kpọrọ economists - na-ekwu banyere okwu ịtụnye ndị ọrụ oyibo azụ dịka ndị NLC na gọọmentị na-akpa, bụ na ọ ga-ebute ihe Bekee kpọrọ "Inflation".
"Inflation" a pụtara na ihe ga-ebido ịda oke ọnụ ahịa.
Ihe a ha na-arụtụ aka sitere n'ihe meburu mbụ mgbe e tinyere ego n'ụgwọ ọnwa.

Kedụ ihe bụ"Udoji Award"?
Jerome Udoji bụ onyeisi ngalaba Ọchịagha Yakubu Gowon, hibere ya maka nhaziagharị ọrụ oyibo na Naịjirịa n'afọ 1972.
Ngalaba a nyere gọọmentị etiti mgbe ahụ ndụmọdụ ka o tinye ego n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ n'afọ 1974.
Ego e tinyere mgbe ahụ butere ntinye ego na ngwaahịa ruru pasentị 34 n'afọ 1975.

Kemgbe onyinye Udoji a, gọọmentị etinyela ego n'ụgwọ ọnwa ugboro ugboro.
Ntinye ego ndị a na-ebutekwa ntinye ego na ngwaahịa.
Ugbua, dịka gọọmentị Muhammadu Buhari kwuru na ha ga-etinye uche ma mara ma ha ga-enye ndị ọrụ puku naira iri atọ ha sị na ha chọrọ, BBC jụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ihe metụtara akụnaụba ma "inflation" ọ ga-abịa ọrịrị.
Devo Okorie kwuru sị "n'ezie, mbuli ụgwọ opekatampe ga-ebute 'inflation', makana ihe ọ pụtara bụ na etu onye na-eri ụgwọ ọnwa na-esi emefu ego ga-agbagote karịa etu ọ dị na mbụ.
"Ndị na-ere ihe ga-ebuli ego ihe ha na-ere makana ha na-ahụta ya na ego ndị mmadụ na-eritezi agbagotela.
"Ọ dị ka onye na-arụrụ onwe ya ọrụ zụrụ ụgbọala ọhụrụ, ọtụtụ oge, onye nwe ụlọ o bi na ya ebuliere ya ụgwọ ụlọ, makana ọ na-ahụta ya na o nwere ego mmefu.
"Mana ọ bụrụ na gọọmentị bulie ụgwọ ọnwa, ma mekwaa ka ọrụ dị icheiche dịrị n'obodo.
Ihe ọ ga-eme bụ na ọ na-emelite etu ego si agbasa n'obodo nke Bekee kpọrọ 'cash flow', nke kwesịrị ime ka inflation a gbadata."
Akụkọ ga-amasị gị









