Aisha Buhari: Akatọghị m mwepụ Onnoghen

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook
Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari achọghị iji isi ekote okwu "na-agbasaghị ya".
Aisha kwuru sị na akụkọ na-agagharị na ọ katọrọ mwepụ Onyeisi ọkaịkpe Naịjirịa bụ Walter Onnoghen, bụ ezigbote asị n'ihi na o tinyeghi ọnụ na ya bụ okwu.
O kwuru nke a site n'ọnụ onye mgbasa ozi ya bụ Suleiman Haruna, nke ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmad depụtara na Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mahadum adịgboroja:
Gọọmentị enyela iwu sị ka ngalaba na-ahụ maka mahadum na Naịjirịa bụ NUC tinye anya n'igbochi mahadum adịgboroja ruru iri isii na ndị ọzọ dị ka ya.
Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Malam Adamu Adamu, gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja, ebe o kwuru na etu mahadum ndị a si ewelite isi abụrụla ihe ihere nye gọọmentị.
Na mba ofesi,
Ihe nwụrụ ka ogbunigwe abụọ gbapụrụ n'ụlọụka dị n'obodo Jolo na mba Philippines eruola mmadụ iri abụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe merụkwara ahụ n'ọdachi a akarịala iri na abụọ na ụma, mana enwebeghi otu ndị kwetara na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a.
Gbasara egwuregwu:
Dị ka a na-akọ, ndị ntọ mmadụ emeela ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị ịwa na Zamfara steeti.
Akụkọ si ebe ahụ eru anyị ntị na-akọwa na ndị ntọ karịrị iri abụọ wụchiri otu ebe ndị mmadụ na-agbakọ ele bọọlụ n'obodo Birnin Magaji, wee tọrọ mmadụ asaa.
N'egwuregwu tenis, Novak Djokovic amaburula iko Australian Open site na imeri Rafael Nadal bụkwa dachịị n'egwuregwu a.

Ebe foto si, EPA
N'etiti Ohaneze Ndigbo na Rochas.

Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na nkwụnyere Ohaneze ndị Igbo kwụnyere Atiku Abubakar na Peter Obi (ndị na-azọ oche onyeisiala n'okpuru pati PDP) enweghị isi.
Rochas onye si n'ọnụ Sam Onwuemeodo bu onye na-ekwuchitere ya ọnụ n'ọha kwupute nke a, kwuru na Ohaneze Ndigbo abụghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị, nke nwere akpati ebe a ga-atụnyeli vootu maobụ ebe a ga-eje tụnyere ha vootu , ya mere okwu ha echukwaala ụmụ Igbo ụra.
Okorocha kwuru na ọ bụghị taa ka Ohaneze ndị Igbo na-akwado Pati PDP maka oche onyeisiala, na-ekwukwa na mgbe ha mere ya na ntuliaka afọ 2015, pati ahụ dara.
O kwuru na ugbua, "Ohaneze Ndigbo kwesiri ihi aka isaa n'anya n'imata pati ha ga-akwado na ntuliliaka na-abịanụ."
Ọzọ,

Ebe foto si, @GarShehu
Anyị agaghị ekwe ka ndị mba ofesi tuziere anyị ihe anyị ga-eme n'obodo anyị.
Ọ bụ onye enyemaka onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu kwuru nke a.
Ọ dọrọ aka na nti a n'Abuja iji saghachi ndị mba UK,Amerika nakwa European union gbasara nkwụsị ọrụ okaipe ukwu Naịjirịa bụ Walter Onnoghen n'ụbọchị Fraide,nke Janụarị iri abụọ na abụọ.
Cheta na ka onyeisiala Muhammadu Buhari wepụchara Onnoghen na o tinyere Ọkaipe Muhammadu Tanko ozigbo nke mere ka ọtụtụ mmadụ katọọ ya bụ atụmaatụ.
N'ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Aka na-achị mba Canada bụ Justin Trudeau achụọla onye na-anọchite anya ndị Canada na mba China bụ John McCallum.
Atụmaatụ a na-eme maka okwu ọjọ McCallum kwuru gbasara ikpe onye gbalitere n'ọkwa n'ụlọọrụ na-eme ihe gbasara ekwenti akpọrọ Huawei.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Novak Djokovic na Rafael Nadal ga-akwata ya taa dịka ha ga-apia bọọlụ agba nke ikpeazụ Australian open nke afọ a.
Djokovic na-achọ ka o rite nturugo ụmụ nwoke na ya bụ asọmpị nke ugboro asaa ebe Nadal nwereike ịbụ nwoke mbụ ga-erite nturuugo grandslam nke ugboro abụọ.
Nkeji taa
Ihe nkiri taa











