Misery Index: Nigeria eso na mba iwe na ọnụma na-eto ndị mmadụ afọ?

Ebe foto si, Getty Images
A kpọpụtala Naijiria dịka mba nọ n'ogogo isii na mba ndị iwe na ọnụma na-achị eze.
Steve Hanke, onye ọkammụta na mahadum John Hopkin dị na mba Amerịka bụ onye mere nchọpụta ahụ.
Na ngụkọ Hanke mere, mba Venezuela bụ mba ọnụma kachasị na-asụ kwụtụ kwụtụ ka ofe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Argentina, Iran, Brazil, Turkey na-eso ya, ebe Naijiria nọ n'ọnọdụ nke isii.
South Africa sochiri Naijiria n'azụ dịka mba nke asaa.
Bosnia na Hergergovian n'ọkwa nke asatọ,
Ebe Egypt na Ukraine nọ n'ogogo nke itoolu nakwa iri.
N'aka nke ọzọ, mba Thailand bụ mba kachasị enwe aṅụrị.
Hanke kọwara n'ozi o wepụtara na Forbes na nchọpụta ahụ gbadoro ụkwụ na mgbakọta enweghị ọrụ, ọnụ ahịa ihe na-ada oke bụ nke Bekee kpọrọ "inflation" na ego ole a na-akwụ n'isi ego a gbazitere n' ụlọakụ bụ nke Bekee kpọrọ "bank lending rate".

Ebe foto si, AFP
Enweghị ọrụ ji pasent 18.8 kawanye njọ na Naijiria n'agba nke atọ nke afọ 2018 dịka mmadụ ruru nde 20.9 bụ ndị enweghị ọrụ, dịka ọnụ ahịa ihe na-ada bụ pasent 11.31 n'ọnwa Februwarị, afọ 2019, site na ngụkọ nke ngalaba na-ahụ maka ngụkọ bụ "National Bureau of Statistics" (NBS) si kwuo.

Ebe foto si, Getty Images
N'okwu ya, Uche Uwaleke, onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba kwuru na nchọpụta Hanke bụ ahụ n'anya e kwe.
Uwaleke onye bụ onyeisi, ngalaba mmụta maka ego na ụlọakụ (Banking and Finance) na mahadum, "Nasarawa State University" kwuru n'ezie na ọnọdụ enweghị ọrụ, ọnụahịa nakwa ụgwọ a na-akwụ maka ego mgbazinye n'ụlọakụ dị elu na Naijiria.
"Anyị ma mmadụ ole nọ enweghị ọrụ. Anyị makwa ọ bụghị ihe ihe dara taa ka ọ na-ada echị nakwwa ụgwọ ana-akwụ i n'ego mgbazinye dị elu."
Gee ihe Uwaleke kwuru n'uju:
Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka okwu a:
@The_Pineal kwuru n'ọnọ n'ọkụmmụọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@janetfashlaw kwụrụ na ọnọdụ Naijiria ka njọ karịa ihe nchọpụta ahụ kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@ComradesSteve kwuru na n'agbanyeghị na ya ji otu afọ efe ala a sị nọ n'ogogo isii dịka ndị ọnụma juru obi, na ya na ndị enyi ya na-enwere onwe ya aṅụrị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4










