Nnamdi Kanụ: Ihe iri dị mkpa onye ndu Ipob kwuru n'ozi ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Image
Nnamdi Kanu, onye ndu otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob, ekwuola na iwu Jọstis Binta Nyako nyere ka a nwụchie ya ọzọ bụ mgba megide ịkpemkwụmọtọ.
Kanu onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara na Radio Biafra n'abali Tọzde, na mba Briten tụrụ arịrị sị "Mkpebi sị n'ụlọikpe megidere ikpemkwụmọtọ, megide nhatanha."
O si na "mkpebi Nyako bụ iji gbodo aja n'inyocha ihe mere na September 14,2017 mgbe ndị agha wakporo ụlọ m bu ihe butere na ya anaghị abịa ụlọikpe."
O tikwara mkpu sị na a na-akpagbu ndị Biafra, ndị Ipob na yanwa bụ onye ndu ha.
Lee okwụ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:
1. Ihe mere m ji eme mgbasaozi ntụmadị a bụ n'ihi ka ihe si aga
2. A na-agba izu megide Ipob, a na agba izu megide Biafra, a na-agba izu megide mụ onwe
3. Mana ihe ọbụla ha kpara agaghị adị ire n'ihi na Chukwu okike Abịama m kwụnyere anyị.
4. Biafra-abịa na mmezu ,anyị ga-ekele gị Chukwu Okike Abiama maka nke a
5. Ndị iro Biafra ga-ada, ha agaghị ebilite ọzọ
6. Anyị ga-ebido isiọrụ anyị n'Israel, nke abụghị na anyị ga-emechi ụlọọrụ anyị dị na Brussel
7. A na m ahụta ibu arọ ndị otu anyị nakwa ndị na-akwado anyị na-agabiga. Ibu arọ ndị a gụnyere ọnwụ
8. Jostis Binta Nyako kposara mgbapụta n'ụlọmkpọrọ e nyere m n'enyochaghị ihe mere na m apụtaghị n'ụlọikpe
9. Ka anyị ghara ịkpọ ganịganị n'ihu ndị iro anyị.
10. Ka anyị gaa n'ihu n'jem anyị rua ala e kwereanyị na nkwa. must continue this very noble march to that promiseland."











