Osun Election: Ihe Ipob, Ahamba kwuru maka mmeri Adeleke n'ụlọikpe

Ebe foto si, Mike Ahamba/facebook
Okwu akpụ n'ọnụ kemgbe Fraide bụ maka mpụtara ntuliaka gọvanọ emere na Osun steeti n'ọnwa Septemba afọ 2018 bụ nke Inec nyere onye ji ọkọrọtọ APC bụ Isiaka Oyetola mmeri.
Onye ya na Oyetola zọrọ ya bụ ọkwa bụ Ademola Adeleke nke PDP wepụrụ ya bụ okwu ụlọikpe na-azọ na ka Inec si kpebie ya bụ ntuliaka ejuchaghị ya afọ.
- Ụlọikpe tribunal pụtara n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Maachi kpebie na ya bụ mmerị a Inec nyere Oyetola nke APC ezighiezi.
- Osun Election: Ụlọikpe enyela Adeleke mmeri
- #OsunDecides: A ga m anara APC mmeri m n'ụlọikpe-Adeleke
- Osun Rerun: Ka o si aga
Mkpebị a ụlọikpe kpebiri n'okwụ a meturu ọtụtụ ndị Igbo n'obi dịka ndị ọtụtụ n'ime ha na-akwado pati PDP dịka ha siri gosi na ntuliaka onyeisiala 2019.
BBC jụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ka ha sị hụta ya bụ mkpebi ụlọikpe gbarasa ya bụ okwu.
Mike Ahamba (SAN) kwuru na ya bụ mkpebi ụlọikpe a gbasara ntuliaka Osun steeti bụ mmeri nye ọchịchị onye kwuo ụche ya na Naịjirịa.
Ahamba sị na " ụdị ihe ndị a na-emebụ mbụ, mana ọ dịka mgbanwe abịawala na Naịjrịa."
Ọ sịkwana ụdị ihe nwekwara ike ime na ntuliaka onyeisiala.

Ebe foto si, Ezenwa Nwagwu
Ezenwa Nwagwu nke Civil Society Situation Room sị na ihe niile gara n'anya ya maka na ụlọikpe ahụ mere ihe ejiri hibe ya.
"Ihe mere ejiri hibe ụlọikpe bụ maka na ndị nọrọndọro ọchịchị nwereike ha aghara ime ihe dịka okwesiri."
Ọ sị na onweghị ihe ituna anya dị n'ime ihe mere.
Ebe Charles Ogbu kwuru na ndị Igbo bụ ndị ikpe nkwụmọtọ na-adị mma.

Okwuru odoro enwu na ọkụkọ anya na ya bụ ntuliaka Osun Steeti agaghị n'anya ya.
N'ihe nke "onye ọbụla bụ onye Igbo nwere aṅụrị ka ụlọikpe sị kagbuo ya.
Okwukwara na nke a gosikwara na Inec emetaghị ya nke ọma.
Ogbu kwuru na ụdị ikpe nkwụmọtọ a ga-ewechite okwukwu ndị mmadụ na ụlọikpe Naịjirịa ma mekwa ka ọgbaagha gharazịa idi na ndọrọọchịchị.
Ebe Rev. Peace Udechukwu nke Ipob sị ihe niile bụ ihe efu n'ihu onye obụla chọro mnwere onwe Biafra.
Udechukwu sị na ihe ahụ bụ ka ewere megherie ndị n'ekweghị ekwe anya ihe nye ha olile anya na ihe ga-adị mma na Naịjirịa.










