Supplemetary elections: Pụtanụ n'igwe taa tụọ vootu- Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị dị mkpa:

Pụtanụ n'igwe taa tụọ vootu- Buhari

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @bashirahmad

Nkọwa foto, Muhammadu Buhari banyere n'ọkwa onyeisiala n'ọchịchị onyekwuoucheya nagba nke mbụ n'afọ 2015

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari akpọọla ụmụ Naijiria oku ka ha apụta n'igwe tụọ vootu na ntuliaka mmeju a ga-eme taa nampaghara ụfọdụ na steeti iri na asaa na Naijiria.

Buhari onye kwuru nke a n'abalị Fraide site n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ya bụ Garuba Shehu, gọrọ agụgọ na o nweghị onye ya na-akwado iche na ntuliaka ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

___________________________________________________________________________

Ihe anyị ejighị nye Okorocha asambodo mmeri-Inec

Rochas Okorocha

Inec ekwuola na ihe kpatara ha ejighị nye Rochas Okorocha, Gọvanọ Imo steeti asambodo mmeri na ntuliaka ọkwa senetọ na-anọchị Imo-West bụ n'ihi na onye nchikọta atụm vootu na mpaghara ahụ nyere ha ozi na a manyere ya amanye ịkpọpụta aha Okorocha dịka onye meriri na ntuliaka e mere .

Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festụs Okoye onye gbara nke a n'anwụ ụbọchị Friade na Markudị kwukwara na ihe yiri ya mere na ntuliaka Oju/Obi constituency dị na Benue steeti, Agaye na Niger nakwa n'Akwa-Ibom steeti.

_______________________________________________________________________________

Michael Rosfeld (n'akpa ekpe) na Anton Rose

Ebe foto si, ALLEGHENY COUNTY JAIL/FACEBOOK

Nkọwa foto, Michael Rosfeld (n'akpa ekpe) na Anton Rose

Enyela otu onye uweojii gbagburu otu nwata onye isi ojii mkpebi lawa -na-ikpe amaghị gị na mba Amerịka.

Michael Rosefeld onye gbagburu Anton Rose ka ọ na-agbara ya ọsọ kwuru na ya chere na nwata ahụ ji egbe mana O nweghị egbe a hụ®ụ n'aka nwata ahụ oge ọdachi ahụ mere nke butere ngaghariiwe oge ihe a mechara.

_________________________________________________________________________________

N'egwuregwu,

Argentina Vs Venezuela: 3-1

Lionel Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lionel Messi gbara ọnyụpa n' asompi enyi na enyi Argentina na Venezuela

Lionel messi gbara ọnyụpa n' asompi enyi na enyi Argentina na Venezuela gbara ụbọchị Fraide ebe Venezuela jiri ọkpụ atọ chara ọkụ a satara otu gosi Argentina nkarị.