Osun Election: Ụlọikpe enyela Adeleke mmeri

Gboyega Oyetola na Ademola Adeleke zọkọra ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2018

Ebe foto si, @Gboyegaoyetola/@IsiakaAdeleke1

Nkọwa foto, Ademola Adeleke zọrọ ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2018
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka nke kwara ọnọdụ n'Abuja Ekwouola na ọ bụ Ademola Adeleke onye fere ọkọlọtọ pati PDP nwere mmeri na ntuliaka Osun steeti e mere n'afọ 2018.

Adeleke na PDP gbara akwụkwọ rịọ ụlọikpe ahụ ka ha kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka e mere n'ọsụn steeti dịka one onye nwetara vootu kachasị na ntuliaka ahụ.

Mana Oyetola na pati ya tinyere akwụkwọ na-ekwu na mkpesa Adeleke achịtaghị aja ma kwukwa na ụlọikpe ahụ emeghị ikike ịnụ ikpe ahụ.

Gboyega Oyetola na Ademola Adeleke

Ebe foto si, @Gboyegaoyetola/@IsiakaAdeleke1

Nkọwa foto, Gboyega Oyetola na Ademola Adeleke zọkọra ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2019

Mana ka ọ dị ugbua, ụlọikpe a kpọpụtala ya dịka onye meriri ma gwa Inec ka ha napụta Gboyega Adeleke nke APC asambodo mmeri e nyeburu ya.

Otiegwu Davido ekelela ndị Osun steeti maka mkpebi ụlọikpe n'okwu nwanne nna ya bụ Adeleke.

Davido onye kwupụtara nke a na igwe Twitter yakwuru n'asụsụ Yoroba nakwa bekee' 'Ihe abịala! Ekelee kele ndị Osun steeti."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

BBC agbarụọla ihu na mwakpo ndị ọrụ ya

Toyosi Ogunseye
Nkọwa foto, Toyosi Ogunseye bụ onyeisi nke mbụ Ọdịda Anyanwụ mba Afrịka nke nta akụkọ BBC

BBC agbarụọla ihu na mwakpo awakporo ndị ọrụ ya abụọ n'oge ntulaiaka a gara aga ma dọọ aka na ntị na onye ọbụla mere nke a ga-echere ha aka mgba.

Onyeisi ụlọọrụ ha na mpaghara West Africa bụ Toyosi Ogunseye kwuru na BBC e meela mkpesa n'aka ụweojii banyere nke a.

N'ụbọchị iri abụọ na asaa n'ọnwa Febụwarị nwaanyị uweojii na mmadụ abụọ ọzọ wakporo onye ntaakụkọ BBC bụ Dooshima Abu n'oge ọ na-arụ ọrụ n'ihu ụlọ gọọmentị ndị Benue Steeti. Ọzọ bụrụ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị onye BBC ọzọ bụ Ajoke Ulohotse, ka otu onye ndọrọ ndọrọ akpọrọ Segun Adewale n'ụzọ si Legọs gawa Abeokuta dịka ọ nọ n'ọrụ ntuliaka.

Ntuliaka ndị Inec

INEC na House of Representative nke Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu PDP na ndị patị ndị ọzọ nọ n' ụlọ nta omeiwu na-esi ọwụ ka emegharia usoro ntuliaka ọchịchị na Naịjirịa

Inec ekwupụtala echi bụ Satọde dịka ụbọchị ha ga- emegharị ntuliaka fọrọ afọ n'ebe ndị enwere ọgbaaghara n'ihe karịri steeti iri na isii na Naịjirịa.

Kọmishọna mgbasa ozi Inec bụ Festus Okoye kwuru nke a mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja, ma kwuo na aga-amalite ịgụ vootu na Rivas steeti n'abalị atọ ọnwa Eprelu.

Anwụchiela ndị ntọrị n'Enugwu

Ndị a na-enyọ na ha bụ ntọ
Nkọwa foto, Ndị uweojii na-enyọ na ha bụ ntọ na-akpa mkpamkpa n'Enugwu steeti

Ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela ndị ntọrị asaa na-akpa ike n'Enugwu.

Mana ha ka na-achọ ndị nke gburu ụkọchukwu bụ Fada Clement Ugwu.

Nkewa akarịala na Naịjirịa - Obasanjo

Obasanjo

Ebe foto si, Getty Images

Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo etile mkpu na nkewa dị na Naịjirịa ugbua a karịa nke dị n'oge agha.

O tiri mkpu a n'Abeokuta ụbọchị bụ Tọzde n'ọgbakọ ndị isi ụlọakụ na ndị ọrụ nyocha akụnaụba bụ Association of Chief Audit Executives of Banks in Nigeria na bekee mere.

N'ofesi,

Golan Heights nwere ikike ọchịchị gbara ya gburu gburu nke butere o ji eko okwu

Ebe foto si, Reuters

Onyeisiala mba Amerika bụ Donlad Trump ekwuola na oge eruola mgbe a ga-anabta Golan Heights dịka ala mba Izrel.

Ala ahụ bụ nke Izrel napụtara Sirịa mgbe ha lụrụ agha n'afọ 1967 ka nọ n'isiokwu kemgbe ahụ.

Ebe mba Sirịa akatọọla okwu a Donald Trump ma kpọọ ya okwu na-abaghị uru ma ncha.

Nyocha ụgbọelu Boeing 737 max

Ụgbọala kpọkasịrị

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụgbọala ahụ kpọkasịrị ka ọ bere oge o ji felie elu gafere

Nyocha ka na-aga n'ihu n'ihe kpatara ụgbọelu Etiopịa Beeing 737 max jiri kpọkasịa.

Ụlọọrụ FAA na mba Amerịka wepụtara ozi na a ga-akụziri ndị ọkwọ ụgbọelu teknụzụ eji ọkwa ụgbọelu ahụ n'ọwa Epurel.

Mana ndị ụlọọrụ ụgbọelu Etiopịa kwuru na ndị ọkwọ ụgbọelu ha niile a natala ọzụzụ teknụzụ a tupu akụkọ ahụ na-apụta.

N'egwuregwu

Otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa

Ebe foto si, @NGSuperEagles

Onyeisi otu egwu bọọlụ Seychelles bú Gavin Jeanne ekwuola na asọmpi ha na ndị Super Eagles nke Naịjirịa taa bụ Fraide ga-adị ka ebe e ji eze eti akị.

Super Eagles ga-ezute Seychelles n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi dị n'Asaba Delta Steeti n'asọmpi ikpeazụ itozuoke n'Iko mba Afrịka.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga