Imo elections: Mmegharị ntụliaka na steeti ahụ ebirila ọkụ

Ndị Ụlọ ọrụ INEC na steeti Imo e gosila nkwado ha banyere mmeghari ntụliaka eji ahọpụta ndị nnọchiteanya nke steeti n'ogbe dị iche iche bụ nke e hiwere echi bụ Satọdee.Okpuru ọchịchị ndị nke a metụtara gụnyere: Ikeduru, Isiala Mbano, Ngor-Okpala, Orsu, Isu, Orlu, Oguta nakwa okpuruọchịchị Njaba.
E yighariri ntụliaka a n'ihi ọgbaghara nakwa tigbuo zogbuo pụtara na ntụliaka mbụ e mere.

Nkwado ụlọọrụ Inec pụtara ihie mgbe ha bagidere atụmatụ ikesa akụrụngwa ndị ahụ dịgasị mkpa eji eme ntụliaka taa.
Mgbe BBC Igbo gara n'ụlọ ọbaego ukwu CBN, a hutara na nkesa akụrụngwa a nọ aga n'ihu dịka o si kwesi.

Ka osi dị, mbọ onye ọrụ anyị gbara ịmata etu ụlọọrụ a si akwado kụrụ afọ n'ala, dịka onu na-ekwuru ha na steeti Imo jụrụ ịza oku akpọrọ ya n'ekwe ntị.Mana onu na-ekwuru ndị uweojii na steeti Imo bụ Orlando Ikeokwu, kọwara njikere ndị uwe ojii dị iji nye ezi nchekwa na-ebe a ga-eme ntụliaka a.





