2019 Elections: APC Imo steeti chọrọ ikwatu Oshiomhole

Akukọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a

APC Imo juru Ịgbanye mkpachapụ Rochas

APC Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, APC Imo steeti nọ n'ọgbaaghara kemgbe afọ gara aga

APC Imo steeti akpọọla oku ka achụpụ Adams Oshiomhole dịka onyeisi pati ha mana ekwusi ike na mkpachapụ ahụ akpachapụrụ Okorocha enweghị isi maọlị.

Onyeisioche Pati ahụ na Imo steeti bụ Daniel Nwafor gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Satọde na Onyeisi Pati ahụ bụ Adams Oshiohmole erubeghiri ụlọikpe isi maka okwu ahụ, nihi ya na ha agaghị ekwenya na ya bụ mkpachapụ.

SERAP Akpụpụla Gọọmenti ụlọikpe

SERAP na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, SERAP gbara Gọọmenti etiti akwụkwọ

Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) Akpụpụla gọọmenti etiti na nke steeti ụlọikpe nke ECOWAS dị n'Abuja maka iji nke Bekee kpọrọ Cyber Crime Act megide, jide maọbụ kpọchie ndị ntaakụkọ maka ikwu uche ha.

SERAP sị na ya bụ agwa gọọmentị na-akpa megidere ikike dịrị onye ịkwu uche ya na obodo Naịjirịa.

Ngagharịiwe na Algeria

Ngagharịiwe Algeria

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ngagharịiwe Algeria

N'ofesi, ụmụakwụkwọ mahadum n'Algeria apụtala ngagharị iwe ịmegide echiche onyeisiala ha bụ Abdelaziz Bouteflika ịtinye akwụkwọ ịso zọọ ọkwa ọnyeisiala nke ụgboro ise.

Bouteflika bụ onye gbara afọ iri asatọ na abụọ (82) kwuru nke a n'ọnwa gara aga bụ nke kpaliri iwe na ọnụma ndị mmadụ na mba ahụ.

Chelsea 2 - 1 Fullham

Premier League

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chelea ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Fulham

N'egwuruegwu e Watford ewerela ọkpụ abụọ asatara otu merie Leicester (2 - 1) na. Ebe Chelsea ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Fulhma.

Gee nkeji anyi ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ndị ọkaiwu Atiku adịla njikere

Atiku Abubakar

Ebe foto si, @Atiku

Dịka okwu siri kwụrụ ugbua, Atiku Abụbakar sị na na ya ehiwela otu iwu ma nye ha ikike iweghachị oke ọ sị ruru ya ezuru ezu

Cheta na Maazị Abubakar bụ onye ji aha pati PDP zọọ ọkwa onyeisiala.

Agbanyeghi na ọtụtụ mmadụ isi ha gbagotere na Naịjirịa nakwa mba ofesi dị iche iche na-akwado ntuliaka, Abubakar na ọ na-ehiwe ndị ọkaiwu ga-ama aka mmeri Buhari meriri ya n'ụlọikpe.

Egbuola mmadụ ọzọ na Kaduna

Nasir el-Rufai

Ebe foto si, Nasir el-Rufai/Facebook

Nkọwa foto, Nasir el-Rufai rụbụrụ ọrụ ka Minista ha ahụ maka Abuja

Ogbugbu mmadụ ka bụkwa ihe a kpụ n'ọnụ na Kaduna steeti ebe ndị oji egbe aga gbagburu mmadụ isii ma merụọ mmadụ asatọ ọzọ ahụ.

Nke a mere ụbọchị Satọde n'obodo Sabon Sara dị nso na obodo Kidandan n'ọchịchị ime obodo Giwa, dịka ndị ntọọ chọrọ ịtọrọ mmadụ.

Ndị na-akatọ oke agbụrụ n'Italị

Ndị na-eme ngagharị iwe agbụrụ

Ebe foto si, EPA

Ọtụtụ igwe mmadụ gbakọtara n'obodo Milan nke mba Ịtali ma mee ngagharịiwe megide ịkpa oke agbụrụ

Nke a bụ iji katọọ iwu gọọmentị ha nyere nke gụnyere ịgbara ndị mbịarambịa ụgbọ nwamkpị ma ọ bụrụ ha mee ihe ọjọọ.

Barca tụrụ Madrid ọkpọ n'isi

Barca na Madrid

Ebe foto si, Getty Images

Barcelona egosila Real Madrid nkarị n'oge a site n'imeri ha ugboro abụọ n'ime ụbọchị anọ.

Barca ji otu ọkpụ goolu merie Madrid n'asọmpi El Classico ha gbara n'abalị ụnyaahụ.

Gee nkeji a n'uju ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri anyi nke taa:

Aha onyonyo, Ndigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere