Charly Boy: Oge eruola mgbe ụmụ Igbo ga-edozi ala Igbo

Ebe foto si, @arefada1/Twitter
Charles Oputa bụ onye otiegwu a ma dịka Charly Boy agwaala ụmụ Igbo na oge eruola ka ha gaa wulite ala Igbo.
N'ozi ọ gbasara na soshal midia ya bụ nke na-ewu ewu, ọ gwara ha ka ṅomie ndị Nnewi na ndị Aba site n'ịgbanwe ebe ndị ahụ jiri ya mee "Legọs" nke ha.
Gịnị mere o ji kwuo nke a?
Mgbe BBC Igbo jụrụ ya, Charly Boy kwuru na ọ hụrụ agwa a na-akpaso Ndigbo na Legọs
Cheta na ụfọdụ Ndigbo kwuru na-akpasara ha agwa na-adịghị mma n'ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala na Legọs.
N'ụbọchị Monde, etiri ụfọdụ Ndigbo ihe ma kwapịa ọdọahịa ụfọdụ n'Oshodi na Legọs ahụnke mere na ụfọdụ Ndigbo chị aka n'obi ugbua.
Ọzọ n'ụbọchị Fraide ka okwu "#Otoge Lagos" wuru na soshal midia ebe ụfọdụ mmadụ ji ohere ahụ agwa Ndigbo ha laa na bee ha.
Mr AyeDee gwara ndị Igbo ha buru ụzọ dozie be ha , hapụ itinye ọnụ n'okwu onye ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Findurvoice_11 gwara ndị Igbo hoo haa ha gaa n'ala ha gaa zọpụta ya n'aka ndị na-emebi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2










