Imo state: 'PDP enweghi mmeri n'Imo state' - Nwafor

Dan Nwafor

Ebe foto si, Dan Nwafor

Nkọwa foto, Dan Nwafor bụ onyeisioche APC n'Imo steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

BBC Igbo kpọrọ otu onye nnọchiteanya otu pati APC ka o tinye ọnụ ya n'ihe gbasara mpụtara ntuliaka ebe Inec kpọpụtara aha Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka Imo steeti.

Dan Nwafor bụbu onyeisi ndị APC n'Imo steeti gwara onye ntaakụkọ BBC na site n'ihe iwu ala Naịjirịa kwuru, na Emeka Ihedioha ekwesịghị inweta mmeri.

Ọ kọwara na iwu Naịjirịa sị na tupu a kpọpụta aha mmadụ dịka onye meriri, na e kwesịrị ka o nweta n'opekatampe pasentị 25 n'ime vootu niile a tụrụ atụ n'ime ihe ruru okpuruọchịchị 18.

O kwuru na onye PDP bụ Ihedioha, enwetarughi vootu pasentị 25 (25%) n'ime okpuruọchịchị 18 n'ime 27 dị n'Imo steeti, nke mere na ịkpọpụta aha ya abụghị n'usoro iwu Naịjirịa.

Nwafor kwuru na dịka iwu si kwuo ya, na ihe Inec kwesịrị ime bụ ikwu ka onye PDP kachasị nweta ọnụọgụgụ vootu na onye AA na-esote ya, gaa megharịa ntuliaka nke a kpọrọ "re-run" na Bekee.

Maka etu onye AA si na pati ha pụọ si merie karịa onye APC ha, o kwuru na ọ bụ ihe mwute na o si etu a dapụta, maka ndọrọndọrọ dị n'ime pati ha.

Kedụ ọnọdụ Hope Uzodimma?

Nwafor kwukwara na APC achụọla Hope Uzodimma na pati ha, maka ime ihe ha kpọrọ "anti-party activities".

O kwuru nke a ka a jụrụ etu ha si hụta ekele maka mmeri Uzodimma kelere Ihedioha.

Ka a jụrụ ya ma ha agaara akwado Uzodimma ma ọ bụrụ na ọ bụ ya meriri na ntuliaka a, o kwuru sị "ọ bụ onye gbụpụ asọ ọ laghachi rachara ya? Anyị agaghị akwado ya".

Etu ndị mmadụ si nabata mmeri PDP

Ka a na-eche mpụtara ntuliaka n'Imo steeti, ụfọdụ ebidola nwewe aṅụrị.

BBC Igbo hụrụ ebe ọtụtụ mmadụ tinyere aṅụrị ha n'igwe Facebook:

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Lekwa ihe ndị mmadụ mere ihe ngosi achụmnta vootu Uche Nwosu n'Owere:

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Isi ụtụtụ ebe elekere anọ n'ụbọchị Monde nke iri na otu n'ọnwa Maachị n'afọ 2019 ka ndị na-anọchite ndị pati ndọrọndọrọ n'ebe a na-agụpụta mpụtara apụrụla akwụkwọ e ji akpọpụta mpụtara, dọkachaa ya ma malite ịlụ ọgụ n'ime 'collation center' n'Imo steeti.

Ọgbaghara dapụtara n'ọgbọ ahụ ka otu nwoke bilitere ọtọ na-aba mba maka etu e si akpọpụta ya bụ mpụtara.

O ji iwe dọrọ akwụkwọ n'elu tebulu ahụ, dọkaa ya. Nke a mere ka onye ọzọ dọrọ akwụkwọ ọzọ dọkakwaa ya.

Akwụkwọ mpụtara

Ndị mmadụ biliteziri ọtọ, kụkọtawa isi, mba a na-arị ibe ya elu.

Tupu ihe a emee, otu nwoke jụrụ jụwaa isi ka otu onye nọ na-ekwu ka a gaa ezumiike makana ọ "chọrọ ịṅụ ọgwụ"; nwoke ahụ kwuru sị na ọ bụrụ na a gaa n'ihu zuo ike, na ihe ga-emebi mgbe ha na-alọghachi.

Lee ka o si mee n'ihe nkiri a.

Aha onyonyo, Lee ebe ndị Imo na-alụ ọgụ maka mpụtara ntuliaka

I lee na Facebook anyị, ị ga-ahụ ka e si na-akpọpụta mpụtara n'Imo steeti tupu ọgụ ebido.

Skip Facebook post, 3

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 3

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti pụtara binye aka ha na wọọdụ ha dị iche iche.

Ihedioha

Ebe foto si, Chibuike Onyeukwu

Emeka Ihedioha na-azọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti, na nwunye ya binyere aka na wọọdụ ya dị na Mbụtụ, Mbaise.

Ha kwuru na obi dị ha ụtọ na Inec rụrụ ọrụ ha nke ọma.

Uche Nwosu na ọdịnịhu Imo steeti:

Uche Nwosu kpọkuru ndị Imo ka ha pụta n'igwe sonye n'ịhazi ọdịnihu Imo steeti maka ọdịnma ha na ọdịnma ndị ntoroọbia.

Aha onyonyo, Taa ka anyị ga-enwe nkwekọrịta gbasara ọdịnihu Imo steeti - Uche Nwosu

O kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ na-akparịtaụka oge ọ tụchara vootu ya.

Uzodimma

Hope Uzodinma na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti n'okpuru pati APC atụọla vootu nke ya.

Uzodimma

Uzodinma na Nwosu so na mmadụ abụọ ndị mmadụ na-atụ anya ka ha mara onye ga-enwe mmeri na ntuliaka a.

Uche Nwosu atụọla vootu n'Eziama Obire.

Uche Nwosu

Uche Nwosu na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati AA.

Uche Nwosu na-azọ ọkwa gọvanọ tiri mkpu n'elu Twittter ya sị na ọ ka nọkwa n'ọsọ a, dịka ndị mmadụ na-ebugharị akụkọ na ọ pụọla na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ka a na-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu taa, ndị Imo na-eche ịma onye ga-achị ha afọ anọ ọzọ.

Ọ bụ n'ụbọchị Satọde 9 nke ọnwa Maachị ka a ga-eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ.

Ọtụtụ mmadụ pụtara ịzọ ya bụ ọkwa dịka e nwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị kariri iri asaa n'ọgbọ a.

Ngụkọ otu webusaịt mere ịji mata uche ndị mmadụ gbasara ndị ha ga-akwado na ntuliaka a gosiri ndị a họpụtara n' Abịa nakwa n'Imo.

Lee ndị welitere isi na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti abụọ ndị a gbara onwe ha agbataobi.

Abia

1) Okezie Ikpeazu - PDP

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Facebook

Okezie Ikpeazu bụ aka na-achịkọta Abia steeti ugbua.

Ọ na-azọ ịchị ya na-agba nke abụọ n'afọ 2019.

N'ozi oji achụnta vootu, ọ na-egosi ndị Abia ihe o merela ha na-agba nke mbụ ya ma na-ekwu na ọ ga-emekarị ya ma ọ zọta ya ọzọ.

2)Alex Otti - APGA

Alex Otti

Ebe foto si, Alex Otti

Alex Otti gbara afọ 53 na-azọ ọkwa ịchị Abịa steeti na ntuliaka 2019.

O kwenyere na ọ meriri ntuliaka nke afọ 2015 mana e zunarịrị ya bụ mmeri.

O kwuru na ọ ga-atọghapụ ndị Abia n'aka ọchịchị nchịgbu.

3) Uche Ogah - APC

Uche Ogah

Ebe foto si, Chima Obiwuru

Uche Ogah dị afọ 49 bụ onye ji ego achụ ego n'ihe gbasara mmanụ agbịdị.

N'afọ 2015, ọ zọrọ ọkwa gọvanọ n'okpuru otu PDP mana ọ gbahapụrụ ha fee na otu APC.

Ọ kọwara na o mere nke a n'ihi na ohere onye kwuo uche adịghị na otu PDP.

4) Nkoro Joseph Ngozi - YPP

Joseph Nkoro

Ebe foto si, Joseph Nkoro

Joseph Nkoro bụ onye ka bụrụ nwata n'ime ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia steeti ebe ọ dị afọ 36.

O kwuru na ihe kachasị ya mkpa ọ ga-eme ma ọ zọta ọkwa gọvanọ bụ ịkwụ ndịọrụ ụgwọ ọnwa ha.

Imo

1) Uche Nwosu - AA

Uche Nwosu

Ọkwa gọvanọ Uche Nwosu na-azọ bụ nke nwere akụkọ na-eso ya kemgbe o kwuputara na ọ ga-azọ.

Ihe butere ya bụ n'ihi na Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo nke na-apụ apụ bụ ọgọ ya nwoke.

Ya mere na o butere ọgbaghara n'etiti pati ndị APC ma rukwa ụlọikpe.

Ugbua, Nwosu na-azọ zi ọkwa gọvanọ n'okpuru pati AA dịka ọ hapụrụ APC maka okwunaụka.

2) Ifeanyi Ararume - APGA

Ifeanyi Ararume

Ebe foto si, Ifeanyi Ararume/Facebook

Ifeanyi Ararume bụbu Sinetọ na-anọchị anya Imo North (Okiwge) n'ụlọomeiwu ukwu nke o meriri n'afọ 1999.

Ọ pụtara n'afọ 2007 ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru PDP mana esemokwu malitere n'etiti ha nke ruru ụlọikpe ma mee ka PDP chụpụ ya na pati ha.

Ugbua, ọ na-azọ ya bụ ọkwa n'okpuru otu APGA.

3) Uzodinma Hope - APC

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Hope Uzodinma

Hope Uzodinma bụ kwa sinetọ ọzọ na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti. Ọ zọtara oche Ọrlu(Imo West) n'ụlọomeiwu ukwu n'afọ 2011.

Uzodinma na Uche Nwosu zọrọ onye ga-anọchị anya APC n'Imo steeti dịka ha kewara agba abụọ n'ime APC n'Imo steeti.

Inec na ụfọdụ ụlọikpe tinyere ọnụ n'okwu dịka e mere ntuliaka imeụlọ abụọ rue mgbe Uche Nwosu fepụrụ na APC fega otu AA.

4) Emeka Ihedioha - PDP

Emeka Ihedioha

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

Emeka Ihedioha bụ onye ọrụugbo nke ukwu nwekwara ụfọdụ ụlọoriri nakwa ahịa mmanụ agbịdị.

Ọ zọtara oche n'ụlọomeiwu nke nta n'afọ 2003 ịncọhị anya Abor-Mbaise-Ngor Okpala. O mechara bụrụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta site n'afọ 2011 rue afọ 2015.

Ọ malitere ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru PDP dịka o meriri ntuliaka imeụlọ nke ha haziri.

5. Ikedi Ohakim - Accord

Ikedi Ohakim

Ebe foto si, Ikedi Ohakim/Facebook

Ikedi Ohakim bụ aka chiburu Imo steeti site n'afọ 2007 rue 2011 n'okpuru otu PPA.

Tupu e mee ntuliaka ahụ na 2007, o si n'otu PDP gbapụta banye na PPA.

O kwuru na Imo anwụchala anwụ, na ọ bu ya mere oji azọ ọkwa agba nke abụọ iji zọpụta ya.

O siri na otu PPA febanye na PDP ma siri ebe ahụ banyekwa n'otu AA ebe ọ nọ azọ ọkwa gọvanọ ugbua.

Akụko ndị ọzọ ga-amasị gị