Anambra state: Onweghi ihe m wepụrụ n'Amachalla - Anayo Nnebe

Ebe foto si, BBC/Anayo Nnebe
Akụkọ pụtara na-ewu ewu kwuru na Anayo Nnebe wepụrụ igwe mmiri nke ọ gbapere n'Amachalla dị n'Anambara steeti maka na o merighi na ntuliaka.
Nnebe bụ onye ji aha APGA zọọ ọkwa nnọchianya Ọka Nọt na Saụt n'ụlọomeiwu nta, dara ntuliaka e mere n'ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị 2019.
Onye ọrụ BBC Igbo gara ebe ahụ hụrụ ndị ọrụ na ya bụ ọdọmmiri, kwuru hoha na akụkọ a na-akọ abụghị eziokwu chacha.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Anayo Nnebe n'ekwentị, o kwukwara na ọ bụghị eziokwu.

O kwuru na ọ gbapuru ọdọmmiri n'ebe ruru iri abụọ na abụọ n'Ọka niile, na nke Amachalla adịghị iche.
Nnebe kwukwara na o nwere ihe mebiri n'ime igwemmiri ahụ tupu e mee ntuliaka, na ọ bụ ya butere akụkọ ụgha nke a.

"Ugbua, igwemmiri ahụ ebidola ịrụ ọrụ dịka e doziri ya ụnyaahụ" ka o kwuru.
Nchọpụta BBC mere nakwa ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị obodo ahụ gosiri na ya bụ akụkọ a na-akọ bụ okpokpo asị kpụ ọkụ n'ọnụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị








