EFCC atọhapụla ọgọ nwoke Atiku ha nwụchiburu

Ebe foto si, @atiku/Twitter
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ngalaba EFCC atọghapụla ọgọ Atiku nke ha nwụchiri kemgbe ụbọchị satọde gara aga.
EFCC nke na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego boro ya ebubo na o mefuru ego ruru yuro nde otu narị na iri ise nke Bekee kpọrọ "Laundering".
Ọnụ na-ekwuchitere EFCC bụ Tony Orilade zipuru ozi a dịka ụlọorụ ntaakụkọ Punch siri kwuo.
Ọzọ
Ndị ụlọikpe etiti dị n'Abuja na ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC, kwekọrịtara sị ka a kwụsị nyocha a na-eme maka ebubo mmefu ego e boro Alex Badeh bụ onye ọchịagha ndị agha mmiri a gbagburu n'ọnwa Disemba 2018.

Ebe foto si, Getty Images
Mana ụlọikpe ahụ mara Iyalikam Nigeria bụ ụloọrụ Badeh ikpe, ma sị ha nyeghachị gọọmentị etiti akụnaụba niile a kpachiri n'aka ha.
Achụọla onyeisi CBN?
Isaac Okoroafor bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ ukwu Naịjirịa bụ CBN, ekwuola na achụghị Godwin Emefiele bụ onyeisi ha, n'ọrụ dịka ndị mmadụ si na-ebugharị na soshal midia.

Ebe foto si, Getty Images
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: CBN ekwuola na achụbeghị Emefiele n'ọrụ
N'ofesi,
Hillary Clinton zọburu ọkwa dịka onyeisiala mba Amerịka, ekwuola na ọ gaghị abịghachị ịzọ ndọrọndọrọ nke afọ 2020.

Ebe foto si, Getty Images
Kama o kwuru na ọ gaghị akwụsị itinye ọnụ ya n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'egwuregwu,
Otu Super Falcons nke Naịjirịa, ga-ezute mba Thailand echi, ebe ha ga-azọ onye ga-azọta agba ngwụcha nke asaa, dịka ha nwetara pọintị atọ n'ime egwuregwu atọ na Group C n'asọmpi Cyprus Womens' Cup.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a:
Ihe nkiri taa:











