CBN Governor: Achụbeghi Emefiele n'ọrụ

Godwin Emefiele

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ pụtara n'ụbọchịanọ nke ọnwa Maachị 2019, kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari chụrụ onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele n'ọrụ.

Ụfọdụ kwuru na Buhari gwara ya sị ya gaa ezumike ga-eru ọnwa atọ ebe ọ ga-esi pụọ n'ụlọakụ ahụ.

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ụlọakụ CBN iji nụ olu ha gbasara okwu a, ha kwuru na o nweghi eziokwu dị na ya.

"Achụbeghi ya n'ọrụ" ka Isaac Okoroafor bụ onye ọrụ CBN gwara anyị.

Aha onyonyo, Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi

Ụlọntaakụkọ Punch kwukwara na ha nụrụ kepu kepu na Emefiele ka nọ n'ụlọakụ ya chịm.

Mana ụfọdụ mmadụ ekwuola na Buhari na-akpa nkata iji onye ugwu na-ekpe alakụba dochie Godwin Emefiele.

Otu n'ime ha dịka @amaniro_s kwuru nke a n'akara Twitter ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ga-amasị gị: