APC Suspension: A kachapụla Osita Okechukwu n'APC

Ebe foto si, Getty Images/Osita Okechukwu fb
Osita Okechukwu kwuru na ihe na-esere ya na Adams Oshiomhole bụ okwu gbasara Juliet Ibekaku bụ onye Oshiohmole chọrọ ka o soro zọọ ọkwa Sinet n'Enugu West Senitorial Zone.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ụnyaahụ.
N'olu ya, "Onweghi ndị pati m na ha na-ese okwu, ọ bụ onyeisioche, Comrade Oshiomhole bụ onye na-ekwu na nwaanyị o wepụtara ka ọ zọọ ọkwa Sinetị agazighi.
M wee gwa ya na nwaanyị a e merighi na ntuliaka imeụlọ, na ọ bụ ya siri ọnwu na ya bụ nwaanyị ga-agariri."
Juliet Ibekaku dara na ntuliaka ịmeụlọ wọodụ ya na Egede n'Enugu Steeti.
Gee Osita Okechukwu ntị ebe a
"Kedụzị ka i si ebo na ọ bụ Okechukwu mere na o merighị?'
Okechukwu kwusiri ike na ume Oshiomhole ezughị ịchụpụ ya n'APC maka na o so hiwe pati APC
N'olu nke ya odeakwukwọ mgbasa ozi ndị APC bụ Mallam Lanre Issa-Onilu kwuru na onweghi asịrị dị na mkpachapụ akpachapụrụ Okechukwu, Okorocha, Amosu na ndị ọzọ.
Na ọ bụ ya tinyere aka n'akwụkwọ eji sị ha gaa zuo ike nwantakiri oge.
Gee Mallam Lanre Issa-Onilu ntị ebe a
O kwuru na onweghi ihe gbasara Oshiomhole na mkpachapụ maka ọ bụ ndị isiọrụ APC bụ National Working Committee na Bekee mere nke ahụ.
"amaghị ka ya bụ okwu sị gbasa Oshiomhole."












