APC: Fayose a na-akwa ha emo maka ihe Oshiomhole kwuru n'Imo?
Akụkọ dị mkpa:
Fayose a na-akwa APC emo?

Ebe foto si, Twitter/Fayose/APC
Aka chịburu Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose, etinyela ọnụ n'okwu Adams Oshiomhole bụ onyeisioche otu APC, kwuru maka onye Onyeisiala Buhari na-akwado na ntuliaka Imo steeti.
Fayose kwuru sị "mgbe onyeisioche pati kwuru na onyeisioche ndị gọvanọ nọ n'okpuru pati ya achịtaghị aja, ekwesịghị ịgwa gị na pati ahụ nakwa gọọmentị ya adaala. Achịtaghị aja n'imo pụtara achịtaghị aja n'Abụja".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
EFCC asaala Union Bank
N'agbanyeghi ihe ụlọakụ Union Bank sara na Twitter ebe ha kwuru na ọ tụrụ ha n'anya na EFCC wepụtara okwu gbasara ego a hụrụ n'ọdọụgbọelu n'Enugwu tupu ha emecha chọpụta, EFCC kwuru na ha ka ga-eme nyocha ọfụma iji mata nke bụ eziokwu.
EFCC gwara BBC na ha ka ji ndị ha nwụchiri maka ego ahụ ruru nde abụọ na puku asatọ.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Anyị ka ji ndị anyị natara nde $2.8 n'Enugu - EFCC
Na mba ofesi,
Awil Dihar Salad so n'ime ndị ntaakụkọ a na-anụ aha ha na mba Somalịa, so na ndị nwụrụ ka ogbunigwe e tinyere n'ụgbọala dị nso ebe onyeisiala mba ahụ bi n'obodo Mogadishu, gbapụrụ.

Ebe foto si, Facebook
Ihe ruru mmadụ iri na asaa merụkwara ahụ na mwakpo a nke ndị oyiegwu Al-Shabab kwenyere na aka ha dị na ya.
N'egwuregwu,
Arsenal agbarala isi onwe ha site n'ígba Burnley ọkpụ atọ asatara otu na Premier League n'izu a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na onye ọbụla kpụ ha n'ọnụ ka Southampton na Liverpool nyeruchara ha goolu atọ atọ oge ha zutere n'izu gara aga.
Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a:
Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela mmadụ atọ ha sị na-eyi uwe ndịagha were atọrị mmadụ

Ebe foto si, Getty/AFP
Ndị ngalaba Federal Special Anti-Robbery Squad (F-SARS) sị na ndị a tọrọ di na nwunyee si Amerịka lọta maka emume ekeresimesi.
Dasuki Galadanchi bụ onyeisi ndi uweoji n'Imo sị na ndị a nọ na-akwọrị dọla ha natala ndị a ha tọrọ mgbe aka ndị uweojii kpara ha.
Buhari kwụ Uzodinma n'azụ -Oshiomhole

Onyeisi oche All Progressives Congress (APC) Adams Oshiomhole ekwuola na ọ bụ Hope Uzodinma ka Onyeisiala Muhammadu Buhari na-akwado na ndọrọndọro oche gọvano n'Imo.
Oshiomhole kwuru nke a ka ọ nọ ebe a na-eme emume mmalite achụmta vootu APC n'Owere.
Cheta na Oshiomhole na Okorocha bidoro ịtụ onwe ha okwu kemgbe emechara ntulịaka imeụlọ nke APC n'Imo, bụ nke ọgọ Okorocha bụ Uche Nwosu so n'ime ndị atunyere vootu.
Ụlọ gọọmentị n'Amerịka agbachiela

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ ọrụ gọọmentị dị iche iche na mba Amerịka agbachiela ka Onyeisiala Donlad Trump na ndị Omeiwu enweteghị nkwekọrịta maka ego mgbidi ọ chọrọ ka agba n'oke Amerịka na mba Mexico.
Nke a bu ugboro atọ ụlọ ọrụ gọọmenti gbachiri n'Amerịka n'afọ a.
Nke a na-abịa ka ụlọikpe nke ukwu n'Amerịka kagbụrụ mmachị Trump tinyere igbochi ndị gbatara ọsọ ndụ itinye akwụkwọ ga-enyere ha aka nwete ikike ịnọ n'Amerịka.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Mohammed Salah dị ọkụ n'asọmpị nke Liverpool na Wolves gbara ụnyaahụ ka onyere goolu otu ma nyekwa aka nwete ọzọ ka ha ji okpụ gọọlụ abụọ asataghi merie.
Anya ga-adị na Alex Iwobi ka Arsenal na Burnley ga-ezute n'ime otu asọmpị a ga-agba taa.
Gee nkeji ndi ebe a:
Lee ihe nkiri nke taa:
Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:













