Tiwa Savage na Yemi Alade a na-akọ ọnụ otele?

Tiwa Savage na Yemi Alade

Ebe foto si, Tiwa Savage/Yemi Alade

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa

Akụkọ na-efegharị na soshal midia bụ na Tiwa Savage na Yemi Alade na-ekpere onwe ha ikpe banyere onye otele ya ka ibu.

Yemi Alade bulitere okwu oge o dere na Twitter ya na "Ọ bụghị ime ka otele gị dịka ka oburu na foto, Ị ma na ị dịka akara edemede 'I'. Kwụsị ịghọgbu ndị ihe gị na-amasị. Were onwe gị ka chi gị ssi kee gị."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'otu aka ahụ, Tiwa jikwara ikpe saa ya.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Tiwa gara n'ihu gwa ya ka ọ ghara ibido ọgụ ọ gaghị alụchali.

'Ọgụ' ahụ butere ndọrịtaụka n'etiti ndị ihe ndị otiegwu abụọ ahụ na-amasị.

Ebe ụfọdụ kwunyere Tiwa, ndị ọzọ kwụnyere Yemi.

@Terrybrainz kwuru na Yemi na-eghu Tiwa anyaọkụ kemgbe.

@Bigstan82745069 kwuru na Yemi Alade ka Tiwa Savage eewu na mba ofesi ọkachasị n'Afrịka, na otele ya kakwa nke Tiwa

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Yemi Alade mechara rịọ mgbaghara maka ihe a odere, ma si na ọ bu ndụmọdu ka ya na-enye ndị mmadụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ọkụ gbara ụgbọala mmanụ na Legos

Ọkụ agbala mmanụ na-ebu mmanụ na nso Maryland Bridge dị na Legos.

Ụgbọ mmanụ na-agba ọkụ

Ebe foto si, @TrafficChiefNG

O nweghị onye ma ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ mana o mere ka ahịrị ụgbọala karia n'okporoụzọ gawara Ọjọta na Ketu dị na Legọs.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

A kpọchiri ebe e hiwere mmalite ọsọ achụmnta vootu Hope Uzodinma n'Owere

Ónú ama Ama egwuregwu Dan Anyiam

Ndị a na-eche na ha na-arụrụ gọọmenti Imo steeti ọrụ kpọchiri ama egwuregwu Dan Anyiam dị n'Owere ebe e hiwere mmalite ọsọ achụmnta vootu Hope Uzodinma.

Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo n'ekwentị, o kwuru na Uzodinma etinyeghị akwụkwọ iji nata ikike iji ama egwuregwu ahụ mee ihe n'aka Kọmịshọna ọ dị n'aka.

EFCC nwuchiri mmadụ abụọ n'Enugwu

EFCC

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, EFCC na-alụ ọgụ megide mmerụaka na ala Naijiria

Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC mpaghara Enugwu anwụchiela mmadụ abụọ bu nde dọla abụọ n'ụma ụbọchị Tọsde na ọdọgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.

Ndị uweojji Spen na ndị Katalonia kwatara

Ndí uweojii Spen na ndí Katalonia

Ndị uweojii mba Spain na ndị obodo Catalonia ndị na-achọ nnwereonwe site na spain kwatara na Barcelona.

Ndị Catalonia ndị na-emem ngagharịiwe tụrụ ndị uweojji okwute,ebe ndị uweojii siri okporo saa ha.

Roy Keane katọrọ ManU maka Mourinho

Roy Keane

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu,

Onye bụbụ onye ndụ otu bọọlụ Manchester United bụ Roy Keane akatọla agwa ndị egwuregwu otu ahu kpasara Jose Mourinho.

Keane sị na agwa ha kpara tupu a chụọ Mourniho bu ihe mechụ ihu. Ọ sị na nke a gosiri na ha abụghi ndị zuru ka eme.

Ndi omekome awakpola ime obodo na Zamfara

Egbe onye uweojii naịjirịa ji

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndi mere ihe ahụ gbagburu ụmụaka na ndị okorobia na-agbalị iche obodo ahụ nche

Akụkọ sị Zamfara na-akọwa na ọtụtụ mmadụ nwụrụ mgbe ndị omekome wakporo ime obodo atọ na steetị ahụ.

Mwakpo a mere na n'okpuru ọchịchị ime obodo Birnin Magaji.

Ndị bi ebe ahụ kwuru na ọtụtụ mmadụ nọ n'ugbo ha mgbe ajọọ ihe a bịakwutere ha.

N'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị,

Saraki

Ebe foto si, Facebook

Onyeisi ndị Omeiwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki akatọla bọọjetị Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ya na ndị otu ya ụbọchị Wenesde.

Saraki sị na ya bụ ihe Bekee kpóró Budget 2019 agaghị enyere Naịjirịa aka.

Ka nke a na-eme, onye bụbụ osote gọvanọ na Kano edurula ụfọdụ ndi na-akwado aka chịbụrụ Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso laghachi APC.

Hafizu Abubakar na ndị otu ya so kwankwaso gbaga PDP n'afọ a, mana ha ekwughi ma ọ ga-eso ha n'azụ na nlaghachi a.

N'ofesi,

James Mattis na Donlad Trump

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, James Mattis na Donlad Trump

Onye odeakwụkwọ Amerịka n'ihe banyere nchekwa bụ Jim Mattis etinyela akwụkwọ arụkwaghịm

Mattis sị na ya mere nke a makana echiche ya gbasara etu Amerịka na mba ofesi ga-emekọta adabaghị.

Ihe na-eme ka Trump si ndị agha Amerịka nọ agha na mba Sirịa lọta.

N'egwuregwu,

Ndị otu Naịjiria ga-aga Rọshịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naịjirịa na mba Congo, England na Czech ga-asọ mpi enyi na enyi tupu e bido asọmpị iko mbaụwa n'ezie

Super Eagles nke NaỊjirịa ka bụkwa ndị nke iri anọ na anọ n'ụwa.

Nke gosiri na ha apụghi n'ọkwa ha no n'ọnwa Ọktoba.

Eagles bụ ndị nke anọ n'Afịrịka ka Senegal ka tụrụ ugo dịka ndi nke mbu n'Afịrịka.

Gee akuko a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa:

Aha onyonyo, Ọ ga-ekwe gị mee, kwuo ihe bụ 'Flag' n'Igbo