Simi bụ nwaanyị a kachasị họpụta na nrite Headies nke afọ a

Ebe foto si, @SympLySimi
Oge itulu ugo nke Headies abịala ọzọ na ngalaba iti egwu na Naịjirịa.
Na ntụlị ugo akpọrọ Headies nke afọ a, onye oti egwu Simi bụ nwaanyị ha kachasị họpụta n'ọsọ ịchọpụta onye kachasị tie egwu n'afọ a.
Headies họpụtara Simi ugboro isi na ntụlị ugo dị icheiche dịka onye egwu ya kachasị ụtọ n'afọ a (Joromi), onye kachasị eti egwu gbasara ihunaanya (Smile for me), egwu mmadụ abụọ gụrụ (No Forget ft Adekunlu Gold), onye olu ya kachasị dị ụtọ (Gone for Good), onye egwu nchịkọta ya kachasị dị utọ (Simisola), na onye kachasị eti egwu n'afọ a.
Ihe mere akụkọ a jiri tụ n'anya bụ makana n'afọ ole n'ole garaaga, ọ bụ ndị oti egwu dịka Tiwa Savage na Yemi Alade bụ ndị a kachasị a họpụta n'ọsọ a dịka ndị kachasị etị egwu n'ime ndị ụmụnwanyị.
Oge BBC na Simi nwere mkparịta ụka taa, Simi kwuru na mbọ ya niile bụ maka ị sọ na ndị ha ga turu ugo na emume dịka Headies.
N'ọnụ okwu ya: "udi ihe a bụ ihe mere ka m na-etinye obi m niile n'egwu niile m na-eti"
Ndị oti egwu ndị ọzọ a họpụtara n´osọ ntụlị ugo a bụ Davido, a họpụtara ya ugboro isi, Headies họpụtakwara Wizkid na Olamide ugboro ise.
Ha ga-eme ntụlị ugo a n'ụbọchị ise n'ime ọnwa Mee n'afọ a.

Akụkọ ga-amasị gị:











