APC Suspension: Ume Oshiohmole ezughi ịwepụ m n'APC - Osita Okechukwu

Ebe foto si, Osita Okechukwu/fb
Kepukepu anụrụ na izu gara aga bụ na-anapụla Osita Okechukwu bụ onyeisi ụlọọrụ Voice of Nigeria (VoN) ọrụ ya.
Na mkparịta ụka ya na BBC, Okechukwu is na ya ka bụ onyeisi ya bụ ụlọọrụ ka ọ dị ugbua.
O mere ka anyị mata na nke bụ eziokwu bụ na ya na onyeisi ndị Pati ha bụ APC bụ Adams Oshiohmole nwere nghọtaghị.
Mgbe anyị jụru ya ka o so na ndị akpachapụrụ na pati APC, ọ zara na nke ahụ abụghị eziokwu.
Gee Okechukwu ntị ebe a
Na ya ka kwụ chịm na APC maka na Oshiohmole ezughi ị wepụ ya na ya bụ pati ya so were hibe.
O kwuru na ya bụ okwu bụ egwuruegwu na ihi na pati nwere usoro eji ewepụ mmadụ.
Okwukwara sị na obi dị ya ụtọ ka ndị Igbo siri tuo vootu na ntuliaka onyeisiala nke gara aga maka nke a ka nke gara aga mma.












