EFCC: Gịnị mere ụfọdụ ikpe nrụrụaka ji egbu oge?

Olukoyede kwuru na o mebeghị mpụ ma ọ bụ nrụrụaka kemgbe ọ malitere ọrụ Efcc

Ebe foto si, Ola Olukoyede/Instagram

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụnụba na nrụrụaka na Naịjirịa bụ EFCC, Ola Olukoyede
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ EFCC ekwupụtala ihe mere ikpe nrụrụaka ha ji n'aka ji egbu oge tupu o ruo n'ụlọikpe.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ola Olukoyede kọwara na ịkpụpụ ndị mmadụ n'ụlọikpe maka nrụrụaka, ọkachasị ndị a ma ama bụ nke e kwesịrị ime ezigbo nnyocha doro anya.

Ọ sị na ọ bụ nke a mere ikpe nrụrụaka ji egbu oge.

Olukoyede onye kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ n'ụlọmgbasaozi Channels TV sịrị n'agbanyeghị na ụfọdụ nnyocha na-egbu oge tupu ọ pụọ ụlọikpe, na nke a apụtaghị na ụlọọrụ EFCC anaghị arụ ọrụ ya.

N'okwu ya, "Tupu abalị abụọ agachaa, enwere m ike ime nnyocha ma kpụpụ onye omekome ịntanetị nke bekee kpọrọ 'cyber criminal n'ụlọikpe".

"Mana ya bụrụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ụlọọrụ ọha maọbụ onye a ma ama mere nrụrụaka, ọ na-egbu oge, agaghị m aga ụlọikpe mgbe m na-adịbeghị njikere."

Kedụ ihe bụ ọrụ EFCC n'ihe gbasara nrụrụaka?

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụnụba na nrụrụaka na Naịjirịa, Ola Olukoyede na akara ngosi Efcc

Ebe foto si, Ola Olukoyede/Instagram

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụnụba na nrụrụaka na Naịjirịa, Ola Olukoyede na akara ngosi Efcc

Kemgbe afọ 2003 e guzobere EFCC, gọọmenti yere ha ọrụ pụrụiche iji belata mmetụta ọjọọ nke mpụ ego nakwa nrụrụaka na Naịjirịa.

EFCC nwere ikike ime nnyocha, ịkpụpụ onye a na-enyo maka mpụ na nrụrụaka ego n'ụlọikpe nakwa ịnapụta ego e zuru ezu.

Mgbochi: Ọ bụ ọrụ ụlọọrụ Efcc igbochi ihe ọ bụla ga-ebute mpụ na nrụrụaka ego.

Nnyocha: Efcc nweta mkpesa gbasra onye mere nrụrụaka, ọ bụ ọrụ ha ime nnyocha gbasara ya ma nweta ihe akaebe gosiri na onye ahụ mere ụdị nrụrụaka ahụ.

Ikpụpụ n'ụlọikpe: Ka EFCC nwetachara akaebe na onye ahụ mere nrụrụaka, ọ bụ ọrụ ha ikpụpụ onye ahụ n'ụlọikpe.

Ọ nọghị ụlọọrụ EFCC n'aka ịma onye a na-enyo enyo ikpe. Ọ bụ ụlọikpe ka ọrụ a dị n'aka. Ụlọikpe nwere usoro ha ji ama onye a na-enyo enyo ikpe.

Kedụ ndị EFCC jidere na nso nso a?

Onye bụbu nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami na onye bụbu aka na-achị Kogi steeti, Yahaya Bello

Ebe foto si, screenshot

Nkọwa foto, Onye bụbu nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami na onye bụbu aka na-achị Kogi steeti, Yahaya Bello

Chetakwa na n'ime afọ 2024, Olukayode fooro ntụtụ taa na ya bụrụ na ọ kpụpụghị Yahaya Bello n'ụlọikpe, ọ ga-agba arụkwaghịm.

A kpụpụrụ Yahaya Bello n'ụlọikpe maka ebubo ndị gụnyere mpụ ihe onwunwe nke ọnụego ya ruru otu narị ijeri naịra na iri (110 billion naira), njehie na mpụ ego ruru ijeri naira iri asatọ na ụma abụọ (80.2 billion) nakwa ebubo ndị ọzọ.

Cheta na ụlọọrụ EFCC boro Abubakar Malami ebubo nrụrụaka na mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

Gịnị mere okwu Yahaya Bello ji bụrụ nke kpụ okụ n'ọnụ?

Onye bụbu aka na-achi Kogi steeti, Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello/Facebook

Nkọwa foto, Onye bụbu aka na-achi Kogi steeti, Yahaya Bello

Olukayede kwuru n'afọ 2024 na ọ ga-eme ihe niile ya maara iji hụ na onye bụbu gọvanọ Kogi steeti gara n'ụlọikpe ma taa ahụhụ dịrị njọọ ya, mezuru nkwa ya ma kpụpụ Bello n'ụlọikpe.

Tupu Yahaya Bello abịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe, e nwere ọtụtụ nsogbu dapụtara mgbe ahụ, ọkachasị mgbe e boro onye nọchiri ya na steeti ahụ dịka oge ọchịchị ya gara bụ Usman Ododo ebubo igbọchi nnyocha ndị EFCC na-eme.

Akụkọ kwuru na Ododo ji ụgbọala ya nakwa ndị nchekwa ya bịa kpọpụ Bello n'ụlọ ya dị n'Abuja mgbe ndị ụlọọrụ EFCC bịara ịnwụchi ya.

Olukoyede sị na o mezuola nkwa ya, na ọ dịziiri ụlọikpe ime ihe ndị ọzọ fọrọ afọ.

EFCC ọ bụ ụlọọrụ gọọmenti nọ n'ochịchị ji emegide ndị mmadụ?

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụnụba na nrụrụaka na Naịjirịa, Ola Olukoyede

Ebe foto si, Ola Olukoyede/Instagram

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụnụba na nrụrụaka na Naịjirịa, Ola Olukoyede

Cheta na nso nso a, ndị mmadụ nakwa ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebo EFCC ebubo na gọọmenti nọ n'ọchịchị ji ha emegide ndị otu pati chọrọ iweghara ọchịchị nakwa ndị ọzọ gọọmenti hụtara ka ndị iro ha.

Mana mgbe onyeisi ụlọọrụ EFCC na-aza ajụjụ ndị ụlọmgbasaozi Channels jụrụ ya gbasara nke a, Olukoyede kwuru na ebubo ahụ abụghị eziokwu.

O nyere ọmụmatụ maka ikpe onye bụbu Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami, onye boro na EFCC kpụpụrụ ya n'ụlọikpe maka njikọ ya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ.

"Ọ dịghị ihe nkeonwe dị n'etiti EFCC na Malami".

"Ya bụrụ na Naịjirịa ga-adị mma ma gaa n'ihu, anyị niile ga-ekwenye na ọgụ a na-alụ megide mpụ na nrụrụaka bụ nke onye ọbụla ga-etinye aka n'ime ya," ka Olukoyede kwuru.