Ụlọikpe enyela Yahaya Bello ntọhapụ beelu

Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello/Instagram

Nkọwa foto, Yahaya Bello
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ụlọikpe ukwu Naịjirịa dị n'Abuja enyela Yahaya Bello bụbu Gọvanọ Kogi steeti ntọhapụ beelu n'ọnụego dị nde narị ise (N500 million).

Ka a kpọlitere ikpe ahụ taa Fraịde 13 Disemba 2024, ụlọikpe ahụ nke Ọkaikpe Emeka Nwite nọ n'isi ya, gwara Yahaya Bello ka o nweta ndị akaebe abụọ nwere ala n'Abuja iji nweta ntọhapụ beelu ahụ.

Ndị akaebe abụọ ahụ ga-enye ụlọikpe ahụ akwụkwọ igosị na ọ bụ ha nwee ala ahụ.

Bello bụ onye ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ bụ EFCC chụwara kemgbe ọtụtụ ọnwa maka ebubo mpụ na nrụrụaka ruru ijeri naịra iri asatọ. Ụlọọrụ EFCC mechara jide Bello n'ụbọchị 26 nke ọnwa Nọvemba 2024 ma kpụpụ ya n'ụlọikpe na 27 Nọvemba.

Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Nwite kwuru ka a kpọchie Yahaya Bello n'ụlọmkpọrọ Kuje dị n'Abuja ruo oge o mezuru ihe dị n'iwu maka ntọhapụ beelu ya.

Ọkaikpe Nwite kwuru ka Bellonye ụlọikpe ahụ akwụkwọ ikike ime njem ya ma

Ụlọikpe ajụla ịtọhapụ Yahaya Bello bụbu Gọvanọ Kogi Steeti

Mgbe Yahaya Bello wụchiri n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ajụla ka agbapụta Yahaya Bello bụbu Govanọ Kogi Steeti n'ebubo metụtara nrụrụaka ego dị otu narị ijeri naịra na ijeri iri (N110bn) nke ụlọọrụ EFCC boro ya.

Ọkaikpe Maryann kwuru na o tinyere akwụkwọ mgbapụta ya a kpọrọ 'bail application' ka ọ fọrọ naanị ụbọchị ise ka a kpụpụ ya n'ụlọikpe.

Bello bụ onye ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ chụwara kamgbe ọtụtụ ọnwa bụ onye ha mechara jide n'ụbọchị 26 nke ọnwa Nọvemba 2024 ma kpụpụ ya n'ụlọikpe na 27 Nọvemba.

Ka ọ dị ugbua, Yahaya Bello ga-anọ n'ụlọmkpọrọ ndị EFCC ruo mgbe a ga-etinye anya n'ikpe ọzọ.

Ụlọikpe nyere EFCC iwu ka ha jichie Yahaya Bello n’ụlọ nga

Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello / Facebook

Nkọwa foto, Yahaya Bello

Ụlọikpe enyela iwu ka ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) jichie onye bubu gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello n'ụlọ nga.

Ụlọikpe nyere iwu ahụ ka Yahaya Bello gọchara sị na aka ya dị ọcha maka ebubo mpụ gbasara ego Kogi steeti ruru ijeri naịra iri asatọ.

Ka ụlọikpe gụpụtachara ebubo niile e boro Yahaya Bello na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụ Shuaibu Oricha na Abdulsalami Hudu; ha niile gọrọ sị na aka ha dị ọcha.

Ọkaiwu Joseph Daudu nọchịtara anya Bello, ebe ọkaiwu Kemi Pinhero nochitara anya gọọmenti.

Yahaya Bello ga anọ n’ụlọnga ndị EFCC ruo n’abalị iri nke ọnwa Disemba, afọ a bụ mgbe ụlọikpe ga-ekpe ikpe ya ọzọ.

Yahaya Bello a gọọla na aka ya dị ọcha n'ebubo N80b EFCC boro ya

Yahaya Bello

Aka chịburu Kogi steeti bụ Yahaya Bello agọrọla isi onwe ya n'ebubo ibupu ego ruru N80bn nke ngalaba na-alụso mpụ agha bụ EFCC n'ịchafụ boro ya.

Dịka apụtara n'ụlọikpe taa, otu onye ọrụ ụlọikpe gụpụtara ebubo ruru iri na isii nke Bello nakwa mmadụ abụọ ndị ọzọ bụ Shuaibu Oricha na Abdulsalami Hudu sara ma gọọ.

Mpụta nke Bello pụtara n'ụlọikpe taa bụ dịka ọnwa olemaole gachara kemgbe akpọrọ ya oku bịa zara ọnụ ya mana ọ bịaghị.

Otu n'ime ahụ bụ n'ọnwa Eprelu mgbe ndị EFCC wụchiri n'ụlọ ya dị na Wuse n'Abuja mana ọ mịpụrụ ha n'aka dịka Gọvanọ Kogi steeti bụ Usman Ododo ji ụgbọala ya bịa buru ya.

Dịka ikpe ahụ na-aga n'ihu n'ụbọchị Wenzde, ndị ọrụ nchekwa dị icheiche ọ kachasị ndị EFCC juputere n'ebe ahụ.

Joseph Daudu bụ Ọkaiwu ukwu bụ onye na-anọchite anya Bello na ndị otu ya dịka Kemi Pinhero bụkwa Ọkaiwu ukwu na-anọchị anya ndị boro ha ebubo.

Ụlọakwụkwọ American International School akwụghachila EFCC ego Yahaya Bello kwụrụ ha maka ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya

Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọọrụ na-achụ mpụ ọsọ na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission EFCC ekwuola na ụloakwụkwọ American Internationa School enyela ha ego $760,910.84.

Ego ahụ so n'ego ruru $845,852 bụ ego e kwuru na aka chịburu Kogi Steeti, Yahaya Bello kwurụ ụlọakwụkwọ ahụ maka ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya na-agụ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Onye nkwuchiteọnụ EFCC bụ Wale Oyewale gwara BBC pidgin na ụlọakwụkwọ ahụ detaburu ha akwụkwọ kwuo na ha chọrọ iziga ego ahụ n'akara ụlọakụ gọọmentị n'ihi na okwu ahụ abụrụla okwu ọha.

Oyewale kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ zitere ego ahụ n'ime ụlọakụ ha ji agbaputa ego nke ha zigara nye ụlọakwụkwọ ahụ.

N'okwu ya; "ụloakwụkwọ ahụ detara anyị akwụkwọ na ha chọrọ itinye ego ahụ n'ụlọakụ gọọmentị...anyị zigakwara ha akara ụlọak gọọmentị, ha zitere anyị ego ahu."

Dịka ọ na -akpọtụ na soshal midia na ụlọọrụ na-ahụ maka ịkpochapu mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa a kpọrọ EFCC boro aka chịburu Kogi steeti bụ Yahaya Bello ebubo were ego ndị Kogi steeti ruru ijeri naira na ụma($845,852,84) kwuorọ ụmụ ya ụgwọ-akwụkwọ n' ụlọakwụkwọ 'America International School of Abuja' (AISA) dị n' Abuja, ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ma ụlọakwụkwọ ahụ ọ kwụghachila ego ahụ?

Nke a na-apụta dịka akwụkwọozi nke ụlọakwụkwọ ahụ degaara EFCC na-arịọ ha ka ha weta akara akpaego ha n'ụlọakụ ka ha were nwee ike ịkwụchigha ego dị $720,000 wuru ewu na soshal midia ụbọchị Fraide.

N'akwụkwọ ozi ahụ, ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na $760,910, bụ ihe fọrọ nn'ego akwụnyere ha nke ha nke ha ji kwuo ụgwọ nke ụmụ aka ahụ na-agụ klasị 'Grade 2 rue 8' gụọrọla agụ.

EFCC na-ebo ebubo na oge ọ bụ gọvanọ na Bello ji ego ndị Kogi steeti kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya ise ego rue oge ha ga-agụcha akwụkwọ.

Mana otu onye welitara is n'ụlọọrụ EFCC na- achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ezịokwu ụlọakwụkwọ AISA detara akwụkwọ gwa EFCC na ha ga-akwughachi egọ ahụ na-ese okwu.

N' ọkwụ ya, “A chọghị m ka akpọ aha m, mana ọ bụ ezịokwu na ndị AISA detara akwụkwọ ka ha kwughachịta egọ ahụ”.

“Ka o si dị ugbua, AISA akwụtala ụfọdụ egọ n’ ime ya ma amaghị m ego ole ha kwụtarala”.

Ọ gara n’ ihu kwuo na ọ bụ n' afọ 2022 ka ndị AISA detara ha edemede ahụ were gwa EFCC ka ha kwụghachị ego ahụ. “ịhe abụghị ọkwụ taata.”

Ihe Yahaya Bello sara

Dịka ebubo e boro ya na-efegharị na soshal midia, Yahaya Bello agọọla na ọ bụghị eziokwu na o ji ego gọọmentị kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Michael Ohiare binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide o kwuru sị, "Yahaya Bello ejighị ego si n'akpa Gọọmentị Kogi steeti kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya."

O kwuru na oge EFCC gakwuru ụlọakwụkwọ ahụ gbalịa ịnapụta ha ego ha sịrị na Bello nwetara n'ụzọ ezighị ezi na Bello gbara ụlọakwụkwọ ahụ akwụkwọ ebe ọkaikpe nyere mkpebi na ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ikike kwụghachi onye abụghị onye nyere ha ego ihe ọbụla.

Ozi si n'aka Michael Ohiare

Ebe foto si, Michael Ohiare

Mbọ BBC Igbo gbara inweta olu ndị nwe ụlọakwụkwọ AISA amịtaghị mkpụrụ dịka ekwentị ha gbanyụrụ agbanyụ.

Ha azaghịkwa ozi e zigara ha n'ekwentị tupu akụkọ a apụta.

America International School, Abuja

Ebe foto si, America International School of Abuja website

Cheta na ihe karịrị otu ịzụụka rue ugbua, EFCC na Yahaya Bello na-akpọtụ maka ebubo metụtara ego ndị Kogi steeti a sị o mefuru n' ụzọ ekwesịghị ekwesị.

N'izuụka gara aga, ndị ọrụ EFCC wakporo ụlọ Bello n'Abuja ebe ha gara ịnwuchi ya, mana ha emelighị ya nke mere ka ha wepụta ozi kwuo na Bello bụ onye a na-achọ achọ maka ịzara ọnụ ya n'ebubo imefu ego ndị Kogi steeti oge ọ bụ gọvanọ.

Bello chịrị Kogi steeti afọ asatọ malite n'afọ 2016 rue 2024.