A sị na ise onyonyo ndị otiegwu bụ ọrụ ụmụnwoke mana eji m ya aracha pịọm - Director Pink

Aha onyonyo, Director Pink: "A sị na ise onyonyo ndị otiegwu bụ ọrụ ụmụnwoke mana eji m ya aracha pịọm"
A sị na ise onyonyo ndị otiegwu bụ ọrụ ụmụnwoke mana eji m ya aracha pịọm - Director Pink
    • Onye dere ya, Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Nwada Praise Onyeagwalam bụ onye ose foto na ihe nkiri egwu na Naịjirịa akọwaala etu o si malite njem n'ọrụ ahụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo mere, Onyeagwalam kwuru na aka ọrụ ya n'ise ihe onyonyo egwu gbapụtara ihe n'afọ 2020, na-agbanyeghi na ọ bụ ụdịrị ọrụ ụmụnwoke jụpụtara na ya.

Nwada a e ji 'Director pink' maara kwuru n'ezie na ọ na-ara ahụ ụmụnwaanyị ime ọfụma n'ọrụ ha, kama na nwaanyị ọbụla tinyere uchu n'ọrụ ahụ ga-eme ọfụma.

Director Pink

Onyeagwala kwuru na ọ bụ n'ihi ya mere ndị na-arụrụ ya ọrụ jiri karịa n'ụmụnwaanyị. N'okwu ya "Ụmụnwaanyị ga-emenwu ya".

Site n'ụlọọrụ ya bụ PinkLine Films, o meela ihe onyonyo ndị otiegwu a ma ama gụnyere Burna Boy, Phyno, Chike, Simi, Wizkid na ndị ọzọ.

Kirie ihe o kwuru n'uju ebe a: