"Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger

Ihedioha

Ebe foto si, Ihedioha Facebook

Nkọwa foto, Ihedioha anọọla na pati PDP kamgbe afọ 1998

Otu onye a ma ama na ngalaba PDP nke Imo steeti bụ Barr. Kissinger Ikeokwu kọwara na ọpụpụ Emeka Ihedioha na pati ahụ bụ nke dabara adaba.

Ọ sịrị na PDP agaala n’ihu na-agbakọrọ pati nọ n’ọkwa ọchịchị n’Imo steeti aka n’ọrụ karịa ịgba ụkwụ megide atụmatụ ya ndị nke na-adịghị mma.

Ikeokwu kwukwara na PDP akụọla afọ n’ala idozi ọtụtụ nsogbu ndị chere ya ihu.

N’okwu ya, “PDP n'Imo steeti so Ihedioha pụọ, ebe ọ bụla Ihedioha gara ka anyị ga-aga.”

Emeka Ihedioha hapụrụ PDP n'ụbọchị Tuzde 23 Eprel 2024 dịka ọ nọchara ọtụtụ afọ na pati ahụ.

Cheta na Ihedioha jiiri aha PDP zọọ ọkwa aka na-achị Imo steeti n'afọ 2015 ma nwetakwa mmeri mana ụlọikpe mechara kagbuo mmeri ahụ ma nyefee ya n'aka APC.

Barr. Kissinger sịrị na PDP agaala n’ihu na-agbakọọrọ pati nọ n’ọkwa ọchịchị n’Imo steeti aka n’ọrụ

Ebe foto si, KISSINGER IKEOKWU/EMEKA IHEDIOHA/FACEBOOK

Ihedioha

Ebe foto si, Ihedioha Facebook

Emeka Ihedioha esila na pati PDP pụọ, gịnị ka ọ pụtara?

Aka chịburu steeti imo na pati People's Democratic Party, PDP bụ Emeka Ihedioha ekwuola na ya esoghizi pati ahụ.

Ihedioha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zigara onyeisi pati ahụ ma tinye n'akara ya na Facebook.

O kwuru na kamgbe afọ 1998 ka ya nọ na pati PDP ma na-etinye ike ya na ọganihu ya.

Mana ugbua, pati ahụ anọghịzi n'ụzọ nkwenye ya.

N'okwu ya, "ọ dị mwute na pati anyị na-agazi n'ụzọ megidere nkwenye m.'

"Agbalịala iweli olu m nye ndumọdụ mana patị ahụ enwezi ike igbanwe n'ime onwe ya, rubere iwu nke ya isi maọbụ welite isi megide pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressive's Congress".

Ihe a ka Ihedioha dere n'akwukwọ ozi ahụ.

O kwuru na n'ihi ihe ndị a o depụtara, ya enweghizi ike ịnọ na ya bụ pati ọzọ.