Lee ndị Gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu surugede ugbua

Rochas Okorocha, Yahaya Beloo, Umar Ganduje, Fayose Fayemi

Ebe foto si, Okorocha/Bello/Ganduje/Fayemi/Facebook

Ihe e ji eme ntuliaka were họpụta onye ga-achị obodo bụ ka e nwee ike ịwepụta onye ma nke ekwe na-akụ ga-echekwaba akụnaụba obodo ma were ya rụọ ọrụ mmepe.

Mana n' obodo anyị bụ Naijiria, ọtụtụ ndị ọchịchị na-ekechị ego ọha niile nwe, tinye n’akpa ha, ka ha na naanị ezinaụlọ ha rie ya.

Mana kwa mgbe kwa mgbe ka ụlọọrụ na-enyocha ka mpụ na nrụrụaka ego si aga bụ Economic and Finacial Crime Commiission(EFCC) na-anwụchị ndị a na-enyo na ha bụ fọnfọnju akpa ma kpụpụ ha n’ụlọikpe.

Ndị ụlọọrụ EFCC wepụtara anya ọbara ọbara tinye ebe ndị gọvanọ di iche iche chichara ọchịchị a na-enyo na ha maburu akatamkpo ego ọha ndi steeti ha na-ejighi ya rụọ ihe ha kwesiri ịrụ.

Lee ụfọdụ ndị gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu ntọpụ ọgọdọ n’ahịa ugbua:

Yahaya Bello nke Kogi steeti

Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello/Facebook

Yahaya Bello chịburu Kogi steeti na EFCC na-agba egwu surugede ugbua n’ihi na o kweghị ka ndị ọrụ gọọmentị ahụ kpụrụ ya.

Ụbọchị wenezde Eprelụ 17 2024, ndị EFCC wakporo ya na be ya dị n' Abuja n’ihi na ha chọrọ iji aka ike kpụrụ ya gaa ka ọ zara ọnụ ya.

Ka ọ gachara awa ole ma ole, gọvanọ nke nọchiri ya n'ọkwa bụ Adodo buuru ndị uweojii na DSS nke ya bịa zupu gọvanọ ahụ, buru ya gaa ebe a mabeghịị.

EFCC wepụtara foto Yahaya Bello dịka onye a na-achọ achọ

Ebe foto si, EFCC

Nkọwa foto, EFCC wepụtara foto Yahaya Bello dịka onye a na-achọ achọ

Ndị ọrụ EFCC kwuru na nke a bụ nnukwu mkparị ka e nyere ha, ma kwuo na o teelarịị aka ha nyere Yahaya Bello akwụkwọ ịkpọ oku ma gwa ya ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ego kariri ijeri naira iri asatọ a sị mefuru.

Yahaya Bello abịaghịkwa n’ụlọikpe ụbọchị tọzde abalị18 Eprelụ bịa zara ọnụ ya.

Ka ọ dị ugbua onye ji ọkwa ọkaaiwu Ukwu nke Gọọmentị Etiti(AGF) bụ Lateef Fagbemi SAN adọọla aka na ntị na onye ọbụla nọ n’okpuru iwu Naijiria na agbanyeghị onye ọ bụ.

Ndị EFCC na ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata( Immigration) ewepụtala akwụkwọ na ha na-achọ Yahaya Bello achọ ugbua.

Willie Obiano nke Anambara steeti

Willie Obiano

Ebe foto si, Willie Obiano

Willie Obiano chiburu Anambra steeti

Ebe foto si, Willie Obiano/Facebook

Nkọwa foto, Willie Obiano chiburu Anambara steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Willie Obianọ chichara ọchịchị gọvanọ Anambara steeti bunye Chukwuma Soludo oche nọkwa na gbata gbata ya na ndị EFCC na-enwe.

Nsogbu nke Obiano na ndị EFCC malitere oge ọ chịchara ọchịchị ọhụrụ.

Gọọmentị machiri ya ime njem gaa obodo oyibo bụ ebe o bibu tupu ọ lata bia bụrụ gọvanọ.

E jidere nwaamadị ahụ n'ọdụ ụgbọelu ebe ọ chọrọ ifepụ gaa ala Bekee.

Kemgbe ahụ ka nsogbu ego ole Willie Obiano mefuru nọ n’ụlọikpe.

Ụbọchị 18 Eprelụ 2024 ka ọkaikpe Jọstis Inyang Ekwo nọrọ n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja kwuo na Obianọ ga-aga n’ihu zara ọnụ ya maka ego karịrị ijeri naira iri ano(N40 billion).

Obiano rịọburu ụlọikpe ka o kwuo na EFCC enweghi ikike ịkpụpụ ya ụlọikpe nke ha na-enwe ihe ọgbụgba ama zuru oke maka ibo ya ebubo.

O gara n’ihu gwa ụlọikpe ka ha kụpụ ya bụ akwụkwọ a gbara ya.

Mana ọkaikpe Inyang Ekwo kwuru na Obianọ ga-azara ọnụ ya n' ebubo itoolu ndị EFCC boro ya.

Ọkaikpe ahụ nyere Obiano ohere ụbọchị iri isii ka ọ gaa ala Bekee nara ọgwụgwọ ahụ ike ma laghachi azụ.

O tinyeziri ikpe Willie Obiano n’uju n'ụbọchị June 24, 25, 26, na 27, afọ 2024.

Abdullahi Umar Ganduje nke Kano Steeti

Umar Ganduje chiburu Kano steeti

Ebe foto si, Ganduje/Facebook

Nkọwa foto, Umar Ganduje chiburu Kano steeti

Ndị chiburu steeti dị iche iche nwere nsogbu na EFCC bụ agụkata agba awaa.

Gọvanọ ndị ọzọ chịbụrụ nwekwara nsogbu n' EFCC bụ gụnyere

Umar Ganduje chịburu Kano Steeti nọ n’ime ofee dị ọkụ ugbua n’ihi ebubo eboro ya oge ọ nọ n’ọchịchị.

Ebubo ahụ nke e gosiri ihe onyinyo ya kwuru na ọ naara ego azụ bụ puku kwụrụ puku dọla ka o were nye ndị ọrụ ngo ọrụ.

Kemgbe ọ nọ n’ọchịchị ka ya bụ nwoke na-agọnahụ aka na ụkwụ ya na ya erigjhị ngarị ahụ.

Ọ gara n’ihu zọọ ma merie dịka onye isi pati na-achị bụ APC.

Mana ụbọchị ole ma ole gara aga, ya na ndị ọrụ EFCC amalitela egwu sụrụgede, nke mere e jiri sị nwamadị ahụ ka ọ rịtugodi dịka onyeisi APC ganye na ọ zachaa ajụjụ ọnụ.

O nwekwara ego ndị ọzọ a na-ebo ya ebubo n’oriri mgbe ọ bụ gọvanọ.

Kayode Fayemi

Ebe foto si, Kayode Fayemi /Facebook

Aka chịburu Ekiti steeti bụ Kayode Fayemi na EFCC gbakwara egwu a gwara ọgwa.

EFCC nyoro Fayemi maka ebubo immefu ijeri naira anọ(4bn), mana Fayemi bụbụ onyeisi otu 'Nigerian Governors’ Forum kwuru na aka ya dị ọcha.

Ayo Fayose nke Ekiti Steeti

Ayo Fayose

Ebe foto si, Ayo Fayose/Facebook

Ayo Fayose bụbụ gọvanọ Ekiti Steeti tupu o nyefee ọchịchị n'aka Fayemi bụkwa onye ọzọ ya na EFCC mara nchoncho aka.

Mohammed Bello Matawalle nke Zamfara steeti

Bello Matawalle

Ebe foto si, Bello Matawalle/Facebook

Bello Matawale bụ minista na-ahụ maka nchekwa ugbua bubu gọvanọ nke Zamfara steeti.

Ụlọ ọrụ EFCC n’ebo ya ebubo na oriri ego kariri ijeri naira iri asaa n’afọ anọ ọchịrị dịka gọvanọ Zamfara .

Rochas Okorocha nke Imo steeti

Rochas Okorocha chiburu Imo Steeti

Ebe foto si, Rochas/facebook

Nkọwa foto, Rochas Okorocha chiburu Imo Steeti

Nsogbu nke Rochas Okorocha chiburu Imo Steeti dịka ihe onyonyo Nolywood.

Kemgbe ọ rịturu n’ọchịchị ka ndị ụlọọrụ EFCC na-achụgharị ya ka ọ bịa zara ọnụ ya.

Cheta oge gara ga ka ndị EFCC si n' elu ụlọ Rochas wee mabata na be ya.

Ọ tụrụ mmadụ niile n’anya n’ihi na Rochas gosiri ya bụ mwakpo na sochal midia na nke a kpọrọ, “Live Video”

EFCC kwuru oge ahụ na ọ bọ makana Rochas ekweghị emepe ụzọ ka a nwụchie ya mere ha jiri were iwe tikaa ụlọ ya bata.

Kemgbe ahụ, ikpe Rochas ka nọ n’ụlọikpe di iche iche Gọọmenti nke Hope Uzodimma gbakwara ya akwụkwọ di iche iche maka akatamkpo ego a si oriri.

Ndị ọzọ gụnyere;

Abdullahi Adamu chiburu Nasarawa steeti.

Aliyu wamako chiburu Sokoto steeti.

Ayo Fayose chiburu Ekiti steeti.

Orji Uzor kalu chiburu Abia steeti.

Chimaroke Nnamani chiburu Enugwu steeti.

kayode Fayemi chiburu Ekiti steeti.

Sule Lamido chiburu Jigawa.

Theodore Orji chiburu Abia steeti.

Timipre Silva chiburu Bayelsa steeti