Ebonyi Traders: 'Gọọmentị kụkpọrọ ọdọahịa anyị na-agwaghị anyị agwa'

Ọdọahịa na ụlọ a kụkpọrọ n'Ebonyi steeti

Ndị na-azụ ahịa na ndị nwe ụlọ gọọmentị Ebonyi Steeti kụkpọrọ na Ogoja road and Vanco junction. dị n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi Steeti etiela akwa arịị maka ihe o furu ha.

Akụkọ kwuru na ọ bụ iji nweta ohere ịrụ 'akwa ụgbọala(flyover) n'ebe Ogoja Road nakwa Vanco Junction' mere gọọmentị ji akụkpọ ewumewu na mpaghara ahụ.

Mana ndị ahịa na ndị nwe ụlọ ndị o metụtara tụrụ arịrị banye ihe zutere ha.

Ndị ahịa abụọ nyere aha ha dịka Anayo na Chimezie tụrụ onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ arịị, sị na e nyeghị ha ozi na a ga-akụkpọ ọdọahịa.

Ha kwuru na zutere ngwaahịa ha n'iro dịka ha amaghị ebe ha ga-akwa ha.

Ha kwuru na o kwesịrị ka gọọmentị nye ha ego itiaka n'obi..

" Ọ bụghị na mmepe obodo adịghị anyị mma, kama nkụkpọsọị ihe a metụtara ebe ọ dị ukwuu."

Ọdọahịa a kụkpọrọ n'Ebonyi steeti

"O nweghị otu mkpụrụ ozi e nyere anyị sị anyị kwapụ."

"Lee onye ọbụla na-agbagharị. Ụfọdụ merụrụ ahụ."

" Anyị enweghị ebe anyị ga-edowe ahịa anyị. Obi adịghị anyị mma ma ọlị."

N'otu aka ahụ, ogbo ya kwuru sị, " O nweghị onye obi dị mma n'ihe na-eme ebe a."

"Anyị asịghị na mmepe obodo adịghị mma, kama a gaara ịgwa anyị ma nye anyị ego iti aka n'obi."

Ọdọahịa a kụkpọrọ n'Ebonyi steeti

"Ọtụtụ n'ime anyị tọọ atọ dịka o mere anyị na mberede."

Oge anyị kpọtụrụ ya,Komishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ bụ Iginia Lebechi Mbam kwuru n'ebubo ndịagha bụ ụgha.

O kwuru na gọọmentị nyere ha ozi afọ atọ gara aga na-aga akwatusi ihe a rụụ ebe ahụ.

N'okwu ego iti aka n'obio, o kwuru na a gwaala ndị nwe ụlọ n'ebe ihe ahụ metụtara ka ha gaa na Ministry na-ahụ maka ọrụ maka ndenye aha.