Ihe butere ọgbaghara merụrụ ọtụtụ mmadụ ahụ n'ahịa Alaba n'Ọktoba
Akụkọ ruru BBC ntị ugbua bụ na ọgbaghara na-ada n'ahịa Alaba International Market dị na Legọs.
Ọnụ na-ekwuru onyeisi ndị ahịa ahụ bụ Emmanuel Amaife sị na ọ bụ ndị "agboro malitere ọgbaaghara mgbe ndị ahịa gwara ha ka ha bupuchaa ụgbọala nakwa ndị ahịa mkpọwa ha na-edochi ụzọ ụgbọala na mmadụ si aga".
Amaife sị na ndị agboro ahụ na-ana ndị mmadụ ego ma hapụ ha ka ha nọchie ụzọ.
Ọ sị na mgbe ndị ahịa chụpụrụ ndị ahụ ka ndị agboro ahụ malitere ịgbali egbe elu, nke butere ọgbaaghara ebe ahụ.
Ọsịkwa na, mgbe egbe tụpakwa ụfọdụ ndị mmadụ ebe ahụ.
Mana ka ọ ọ dị ugbua, ahịa mechiri emechi.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamine Hundeyin sị na ha anụbeghị maka ọgbaghara a mana ka ya kpọọ onyeisi ndị uweojii ebe ahụ kpọghachị ya.

Kedụ ka ihe si kwụrụ ugbua?

Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ ịma ihe na-akpọtụ, onyeisi ahịa bụ Caminus Nnamdi Amajuoyi kọwara na o teela aka a na-ese okwu a.
Okwu bụ ịgwa ndị agboro bupu ụgbọala n'ọnụọzọ ahịa iji mee ka ọ dị mfe ndị mmadụ ịbata bịa zụọ ahịa.
Nke a mere ka ndị isi ahịa gaa mee mkpesa na nke Igwe mpaghara ahụ a na-akpọ Baale
Baale nyere ndị isi ahia oge ịlaghachi ka ekpee ya bụ ikpe ebe 12 nke ehihie mana ndị agboro ahụ pụtara n'ụtụtụ a wakpoo ndị ahịa ma gbaa ụfọdụ n'ime ha egbe.
Dị ka o si kwuo, ngwa ndị e ji wakpo ha gụnyere mma, karama, egbe nakwa onyeike.
O were njikọ aka ndị uweojii, ndị agha nakwa ndị DSS iji chụsasị ndị ahụ ma kwụsị ọgbaghara.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na mmadụ ruru 37 merụrụ ahụ na ya bụ ọgbaghara ebe otu onye nwụrụ.
Ụfodụ n'ime ndị ahụ nọ n'ụlọogwụ ugbua anata ọgwụgwọ.










