Ahụhụ m tara n’ogige ịgba ohu cyber n’obodo Myanmar

- Onye dere ya, Suneth Perera and Issariya Praithongyaem
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
"Ha yipụrụ uwe m, mee ka m nọdụ n'oche ma tinye m ọkụ latrik n’ụkwụ m, e chere m na ọ bụ oge ọnwu m."
Ravi, onye Sri Lanka gbara afọ 26, gara njem na Thailand ịga rụọ ọrụ nkanụụzụ ‘IT’, ma kama ịnọdụ n'ụlọ elu dị na Bangkok, ọ hụrụ onwe ya n'ime ụlọ na-adịghị mma na Myanmar.
A tọọrọla ya gaa n'ofe osimiri dị nso n'obodo Mae Sot dị na Thailand.
N'ebe ahụ, okwuru na e rere ya n’aka ọtụtụ ogige ndị otu na-asụ n'olu mba China na-eme wayo n'ịntanetị. Ha na-enwere ike manye ndị a e rere ere dị ka Ravi ka ha rụọ ọrụ ọtụtụ awa na ọrụ aghụghọ ndị a, nwere njirimara adịgboroja nke ụmụnwaanyị na-aghọgbu ndị nwoke na mba US na mba Europe.
Onye ọ bula ha nwetere, agwa ya ka o tinye ego buru ibu n'azụmaahịa adịgboroja ha, ekwe ha nkwa uru buru ibu.
Ọrụ a Ravi na-arụ n’ogige zoro ezo na Myawaddy, bụ mpaghara na-adịghị n'okpuru ọchịchị ndị agha Mianmaa.
Dịka Interpol si kwuo, ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ si Eshịa, ọwụwa anyanwụ Afrịka, Saut Amerịka na ọdịda anyanwụ Europe, bụ ndi a na-ekwe nkwa ọrụ ndị metụtara kọmputa ma ọ bụrụ na ha rụọ ọrụ omempụ cyber ndị a.
A na-eti ndị jụrụ isoro iwu ahụ ihe, taa ha ahụhụ maọbụ dinaa ha n'ike.
Ravi gwara BBC na ya "nọrọ abalị 16 n'ụlọmkpọrọ maka erubeghị isi, naanị mmiri a gwakọtara na ntụ sịga ka ha nyere ya ka ọ ṅụọ"
Ọ kwuru na "ụbọchị nke ise maọbụ nke isii m nọ n'ụlọmkpọrọ, a kpọtara ụmụ agbọghọ abụọ n'otu mkpọrọ dị nso. ụmụ okorobịa 17 edinaa ha n'ike n’iru ya.”
"Ravi sịrị na otu n'ime ụmụagbọghọ ahụ bụ nwa amaala Filipin, mana ọ maghị maka obodo ndị nke ọzọ ọ metụtara."
Kedu ndị bụ ndị a erere ere?

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'onwa Ọgọst afọ 2023, ọgbakọ UN mere atụmatụ na ihe karịrị mmadụ 120,000 na mba Myanmar na mmadu 100,000 ọzọ na Cambodia ka a manyere ịrụ ọrụ aghụghọ ndị a na ndị ọzọ n'ịntanetị dịka igwu chaa chaa a na-akwadoghị tinyere aghụghọ kripto.
Otu akụkọ sitere na Interpol n'afọ gara aga chọpụtara ebe ndị ọzọ a na-eme aghụghọ n'ịntanetị na Laos, Philippines, Malaysia, Thailand, na Vietnam.
Onye na-ekwuchitere ndị Interpol gwara BBC na omume a bụ ihe iyi egwu juru ụwa ọnụ. Ọ kwuru na a chọpụtara na ọtụtụ mba ndị ọzọ na-etinye aka na aghụghọ, bụrụ ụzọ njem ma ọ bụ bụ mba ndị na agba mgbere mmadụ.
Na mbido ọnwa a, gọọmenti India kwupụtara na ọ gbapụtala mmadụ ruru 250 ndị erere ere na mba Cambodia, ebe n’ọnwa Maachị, China kpọghachitere ọtụtụ narị ụmụamaala ya n'ụlọọrụ aghụghọ na Myanmar.
Beijing na-agba mbọ ka gọọmentị ndịagha Myanmar na ndị agha ndị ọzọ ghara imechi ogige ndị a.
Ndị ọchịchị Sri Lanka kwuru na ha maara mmadụ 56 ndị ndị tọrọ atọ n'ebe anọ dị iche iche na Myanmar, n'agbanyeghị na onye nnọchianya Sri Lanka na Myanmar, Janaka Bandara, gwara BBC na anapụtara asatọ n'ime ha na nso nso a site n'enyemaka ndị ọchịchị Myanmar.
Maka ndị na-akwado ogige ahụ, ọ bụ ọtụtụ ndị na-akwaga mba ọzọ ka ha na-achọ.
Kwa afọ, ọtụtụ narị puku ndị injinịa, ndị dọkịta, ndị nọọsụ na ndị ọkachamara nkanụụzụ nke bekee kpọrọ ‘IT’ n’aha ịchafụ si Saụt Asia na-akwaga ịchọ ọrụ na mba ọzọ.
Ọkachamara kọmputa bụ Ravi, onye akụnaụba ya nọ na nsogbu, na-agba mbọ ịhapụ Sri Lanka kemgbe ọ matara banyere onye na-ewe ndị ọrụ n'ime obodo na-enye ọrụ ntinye data na Bangkok.
Onye na-ewe ọrụ na otu onye si Dubai kwere Ravi nkwa na ụlọọrụ ha ga-akwụ ya ụgwọ ọnwa dị 370,000 rupees ($ 1,200).
Dịka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ, Ravi na nwunye ya naara ego mgbazinye dị iche iche iji kwụọ ndị ọrụ obodo ahụ ụgwọ n’ihi na ha nwere olileanya na ọrụ a nwereike ime ka ha rụọ ụlọ nke ha.
Site na Thailand ruo Myanmar
Na mmalite afọ 2023, e zigara Ravi na otu ndị Sri Lanka na Bangkok wee ziga ha Mae Sot, dị na ọdịda anyanwụ Thailand.
"A kpọgara anyị n'otu ụlọoriri na ọṅụṅụ, ma n'oge na-adịghị anya, e nyefere anyị n’aka ndị ojiegbe abụọ. Ha kpọgara anyị na Myanmar," ka Ravi kwuru.
Ndị omekome na-asụ asụsụ Chaịna na-elekọta ha, ma gwa ha ka ha ghara ise foto.
O kwuru na "egwu ji ha ma kọwaa na ihe dịka ụmụokorobịa na ụmụagbọghọ 40, gụnyere ndị Sri Lanka, ndị si Pakistan, India, Bangladesh, na mba Afrịka, ka ejidere n'ike n'ogige ahụ."
Laukkaing, obodo dị n'oke Burmese, apụtala dịka ebe ịgba chaa chaa, ọgwụ ike, na ebe ojoro na ewuewu.
Ravi kwuru na mgbidi ndị toro ogologo na waya gbachiri ebe ha nọ, nke gbochiri ha ịgbapụ, ebe ndị ji egbe na-echekwa ọnụ ụzọ mbata kwa elekere.
Dịka Ravi si kwuo, a manyere ya na ndị ọzọ ịrụ ọrụ ruo awa 22 kwa ụbọchị, ma nweta naanị otu ụbọchị ezumike kwa ọnwa.
A na-eti onye ọ bụla nupụrụ isi ihe, maọbụ ọ kwụọ ụgwọ.
Otu nwoke mere ihe ndị a kpọmkwem bụ Neel Vijay, onye dị afọ 21 si Maharashtra nke dị n’ọdịda anyanwụ India, onye e bugara na Myanmar ya na ụmụnwoke ise India ndị ọzọ na ụmụnwaanyị Filipin abụọ n’ọnwa Ọgọst afọ 2022.
Ọ gwara BBC na otu enyi nne ya kwere ya nkwa ọrụ n'ụlọọrụ na-ahụ maka oku ekwentị ‘call centre’ na Bangkok, ma kwụọ ya ụgwọ ọrụ 150,000 rupee ($1,800).
Neel kwuru na "e nwere ọtụtụ ụlọọrụ ndị na-asụ China na-elekọta bụ ndị aghụghọ. Ọ bụ ndị ahụ ka eresiri ha".
"Mgbe anyị rutere ebe ahụ, enweghị m olileanya. Ọ burụ na nne m enyeghị ha ego mgbapụta ahụ, a gaara ata m ahụhụ dịka ndị ọzọ."
Ezinaụlọ Neel kwụrụ ndị otu ahụ 600,000 Indian rupees ($ 7,190) ka ha hapụ ya mgbe ọ jụrụ itinye aka na ojoro ahụ, nke a bụ ka ọ hụrụ ntaramahụhụ a na-enye ndị na-emezughị ebumnuche ahụ ma ọ bụ enweghị ike ịkwụ ụgwọ mgbapụta ha.
Mgbe a hapụrụ ya, ndị ọchịchị Thai nyeere ya aka ịlaghachi India, bụ ebe ezinaụlọ ya bidogoro agha megide ndị na-enwe ọrụ n’obodo ahụ.
Neel mechara laghachi India n'ihe na-erughị izuụka abụọ site n'enyemaka nke ndị ọchịchị Thai.
Ndị ọrụ Thai na obodo ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ iji nye aka kpọghachi ndị ihe a metụtara. Otu onyeisi na ngalaba na-ahụ maka ikpe ziri ezi mba Thailand gwara BBC na ọnụ ọgụgụ ndị ejidere n'ike, karịrị ndị a napụtara.
Osote onyeisioche nke Ngalaba nchọpụta pụrụiche (DSI) na Thailand bụ Piya Raksakul kwuru "Anyị kwesịrị ịgbasa ozị, kụziere ndị mmadụ banyere ọghọm dị n'ime ihe ndị a ka ha wee chekwaa onwe ha.
Ndị na-atụ mgbere mmadụ na-ejikarị Bangkok mere ebe njem ha maka na ọtụtụ mmadụ sị mba gụnyere India na Sri Lanka nwere ike iji akwụkwọ visa a na-enye na mbata banye Thailand. Ọ bụ ya mere ndị omempụ na-eji nke a eme ihe mpụ dị icheiche.
Ka ndị wayo si arụ ọrụ
Ravi kwupụtara na a gwara ya ka o lekwasị anya n'ụmụnwoke bara ọgaranya na mba ndị dị n'ọdịda anyanwụ, site n'iji nọmba ekwentị ezuru ezu, soshal mịdịa na idegara ha akwụkwọ ozi.
Ha na-akpọtụrụ ndị ahụ ihe metụtara ozugbo, na-eme ka ha kwenye na ozi mbụ na-abụkarị “daalụ” nke ezitere na mmejọ.
Ravi kwuru na ụfọdụ ndị hụrụ ozi a na-hapụ ya, mana ndị ọ bụ naani ha na ndị na-achọ mmekọahụ ka ọnya ha na-ama.
Mgbe nke a mere, a manye otu nwaagbọghọ nọ n'ogige ahụ ka ha see foto na-egosi ahụ ha iji dọtakwuo ha.
Ndị ọchịchị Thai napụtara Neel, onye India tara ahụhụ gbara ọsọ gafee osimiri ahụ ka ọ nọrọ n’ebe nchekwa.
Mgbe ha zigara ọtụtụ ozi n'ime ụbọchị ole na ole, ha ga-enweta ntụkwasịobi ụmụnwoke ndị a, mee ha ka ha tinye ego buru ibu n'ahịa adịgboroja ịntanetị ha na-eme nke akụrụngwa adịgboroja ha ga-egosipụta na etinyere ego na uru dị na-ya.
Ravi kọwara na "Ọ bụrụ na mmadụ tinye $100,000, ha na-enyeghachi ha $ 50,000, gwa ha na ọ bụ uru ha. Nke a na-enye ha echiche na ha nwere $150,000 ugbu a, ma n'eziokwu, ọ bụ ọkara $100,000 ha tinyere, ebe ọkara nke ọzọ bụ nke anyị.
Mgbe ndị wayo a nwere ihe niile ha nwere ike ịnapụta ndị ahụ o metụtara, ihe na-egosi ọbaego ha na soshal mịdịa ha efuo.
O siri ike ịkọ akụkụ mpụ ndị a, mana ndị ọrụ FBI chọpụtara na ọnụọgụgụ mpụ mere n’afọ 2023, gosiputara na enwetara mkpesa karịrị 17,000 gbasara ọrụ aghụghọ ịhụnanya na mba Amerịka na ego furu efu nke ruru $652m.
Ahụhụ nke mmụọ na nke anụ ahụ

Mgbe otu ọnwa gasịrị eji ya, Ravi kwuru na e resịrị ya n’aka ndị otu ọzọ n'ihi na "ụlọ ọrụ" ọ na-arụ ọrụ na mbụ dara ogbenye. A kpọfere ya n'aka ndị otu atọ dị icheiche n'ime ọnwa isii ọ nọrọ na Myanmar.
Ọ gwara ndị omekome ọhụrụ a na ya achọghịzị ịga n'ihu n’ọrụ wayo, ma rịọ ka a hapụ ya ka ọ laghachi Sri Lanka.
Ravi kwuru na otu ụbọchị, ya na onyeisi ndị otu ahụ nwere esemokwu mere ha lụọ ọgụ, a kpọgara ya n'otu ụlọmkpọrọ ma taa ya ahụhụ ruo ụbọchị iri na isii.
N'ikpeazụ, "onyeisi ha na China" bịara ịhụ Ravi ma nye ya "ohere ikpeazụ" ka ọ rụọ ọrụ ọzọ n'ihi anya doro ya n’ihe gbasara kọmputa.
Ravi kwuru na ya amaghị ihe ya ge-eme n’ihi na e merụrụ ha ahụ dị egwu.
Otu onye a tọhapụrụ n'ọrụ ndị omekome wayo na Myanmar sere foto a ka ha na-aga n'okeala.
Ruo ọnwa anọ ọzọ, Ravi jikọtara akara soshal mịdịa “Facebook” na igwefoto vidiyo 3D nke eji VPN guzobe.
Ka ọ dị ugbu a, Ravi rịọrọ arịrịo ka e kwere ya gaa Sri Lanka ka ọ hụ nne ya na-arịa ọrịa, mana ekweghị ya.
Onye isi ndị otu ahụ kwetara ịhapụ Ravi ma ọ bụrụ na ọ kwụrụ ihe mgbapụta nke 600,000rupee ($ 2,000) na mgbakwunye 200,000 rupees ($ 650) maka ịbanye Thailand.
Nne na nna ya biri ego, dobe ụlọ ha dị ka ihe akaebe wee nye ya, ewee kpọghachi Ravi na Mae Sot.
Mgbe a tara ya ntaramahụhụ o ji wee kwụọ ego ruru 20,000 Thai baht ($ 550) n'ọdụ ụgbọelu maka enweghị akwụkwọ visa, nne na nna Ravi gara biri ego ọzọ.
O kwuru, sị: "Mgbe m rutere Sri Lanka, e nwere m ụgwọ ruru 1,850,000 rupee ($6,100).
Agbagheghị na ọ ọlọghachila ugbu a, Ravi ahụbeghị nwunye ọhụrụ ya.
"Ana m arụ ọrụ ehihie na abalị n'ebe a na-adọba ụgbọala iji kwụọ ụgwọ a. Anyị ejirila mgbanaka agbamakwụkwọ anyị abụọ kwụọ ụfọdụ ụgwọ ha ji."









