Francis Ogolla: Onyeisi ndịagha Kenya nwụrụ n’ihe mberede ụgbọelu helikọpta

Onyeisiala Ruto na onye isi ndị agha nchekwa Kenya General Francis Ogolla

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Foto Onyeisiala Ruto na onye isi ndị agha nchekwa Kenya General Francis Ogolla na ụbọchi 28 February

Onyeisi ndịagha kachasị elu na mba Kenya bụ Gen. Francis Omondi Ogolla anwụọla n’ihe mberede ụgbọelu helikopta ndịagha n'ọdịda anyanwụ mba ahụ.

Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto kwuru na Ogolla na ndịagha iri na otu ndị ọzọ nọ na helikopta ahụ. Naanị mmadụ abụọ jị ndu ha pụta.

Ruto kpọkọtara ọgbakọ ndị otu nchekwa ngwa ngwa o nwetere ozị maka ọnwụ ha. Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ọnwụ Ogolla bụ "oke ihe mwute" nye obodo ahụ.

O kwuru na ihe mberede a mere n'elekere abụọ. O mere ka a mara na ndịagha ụgbọelu Kenya ezipụla ndị otu na-eme nyocha ikuku ka ha mata ihe kpataraihe mberede ahụ.

Onyeisiala Ruto kwuru na ụgbọelu ahụ dara na mpaghara Elgeyo Marakwet, ihe dị ka 400km (250 kilomita) n'ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke isi obodo Nairobi, obere oge ka o fepụrụ.

A họpụtara Ogolla n'ọwa Epureel afọ gara aga ka ọ rụchara ọrụ dịka ọchịagha nke ndịagha ikuku na osote onyeisi ndị agha nchekwa.

Ruto kọwara Ogolla dịka ezịgbo onye agha nke nwụrụ n’ịru ọrụ.

Onyeisi ndị agha Gen Francis Omondi Ogolla

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi ndị agha Gen Francis Omondi Ogolla

N’okwu ya, “Ezigbo onye agha obodo anyi alaala mgbụọ”

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mba kenya ga-enwe ụbọchị atọ iru uju abalị atọ iji nke ga-amalite taa bụ Fraịde. E mere ka amata na ọkọlọtọ obodo ga-efe n’ọkara mast.

Ozi sitere n’websait ndị ọrụ nchekwa kenya kwuru na Ogolla banyere ọrụ agha nchekwa mba ahụ n’ọnwa Eprel 24, 1984.

O kwesiri ịgba afọ iri anọ ‘40’ dịka onye ọrụ agha n’ịzu ụka n’abia.

Ozi kwuru na Ogolla malitere ọrụ dị ka onye agha ikuku nke mba ahụ, ebe ọ zụrụ azụ dị ka onye na-anya ụgbọelu ndị agha ikuku mba Amerịka. Na 2018, ọ ghọrọ ọchịagha nke ndị agha ikuku.

Mmadụ itoolu ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ bụ Brig Swale Saidi, Col Duncan Keittany, Lt Col David Sawe, Maj George Benson Magondu, Capt Sora Mohamed, Capt Hillary Litali, Snr Sgt John Kinyua Mureithi, Sgt Cliphonce Omondi, na Sgt Rose Nyawira.

Onyeisi oche nke African Union Commission bụ Moussa Faki Mahamat, kwuru na "Na ha na-etinye onyeisiala Kenya, gọọmentị ya na ndị kenya ni’ile ekpere maka ihe mberede helikopta a dị egwu".

mmadu abụọ ahụ ji ndụ ha pụta n’ihe mberede ahụ nọ n'ọnọdụ dị oke egwu ma na-anata ọgwụgwọ.

Ndị ọrụ agha ahụ gara na mpaghara North Rift nke Kenya, bụ nke ndị ohi juru.