Alaba Market: Ọgbaghara ọ dara mgbe ndị mmadụ pụtara ịnata PVC ha n'Alaba n'ezie?

Ụbọchị Tọzde Juun 9, 2022 ka ndị oree ahịa gbachịrị ọdọ ahịa ha ma kwesie ike ije nara PVC ha.
Mana ọgbaghara dapụtara n'Igbede dị na mpaghara ahịa Alaba International mere, ka nke a na-eme, ụfọdụ ebe ndị ọzọ dị jụụ.
Nagbanyeghị nke a, ebe ndị anyị hụrụ gosiri na e nwere ebe ndị mmadụ kwụ n'ahịrị idebanye aha ha maka ntuliaka.
Ụfọdụ ndị ahịa jiri ọnụ kọwa ihe ha gabigara mgbe ha pụtara idebanye aha ha.
Onyeisi ndị ahịa n'Alaba International Market bụ Paulinus Ugochukwu kọwakwara etu ndị ahịa si wee kpebie ịgbachị ọdọ ahịa ha ka ha nwee ohere ije nata PVC ha.
Kirie ihe onyoonyo a n'uju ka ị ghọta etu ọghaghara a si wee dap.ụta:

Kedụ ka ya bụ okwu si wee bido n'Alaba International Market?
Na Legọs, ndị ahịa Alaba International Market mara ọkwa ka ndị mmadụ ghara ịbịa ahịa echi bụ Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Juun, 2022.
Ha kwuru ka onye ukwu na onye nta na-azụ ahịa ebe ahụ gbaa mbọ gaa nweta PVC nke ha.
Onyeisi gburugburu ndị na-azụ ahịa 'Electronics' n'ahịa ahụ bụ Paulinus Ugochukwu, gwara BBC Igbo na ha chọrọ ka ndị na-azụ ahịa nwee ike ịtụ vootu n'afọ 2023, n'ihi na ọ bụ "ọrụ dịịrị gị dịka nwa amaala".
O kwuru na ọ bụrụ na ha emechighi ahịa na ndị mmadụ agaghị eje nata PVC nke bụ na ụbọchị ntuliaka ha agaghị ihe ha ga-eji tụọ vootu.
Maazị Ugochukwu kwuru na ọ bụ iwu ka ha tinyere, nke ha kpọrọ "Operation show your PVC", ma kwuo na ha chọrọ ka ndị ahịa ndị ọzọ ṅomie atụmatụ ha a.
O kwuru na oge ga-abịa mgbe ha ga-eme ya ka ọ bụrụ na i jighi PVC gị, agaghị ekwe gị bata ime ahịa.
O kwuru na enweghi ihe o mere ma ọ bụrụ na otu ụbọchị fulaghị ha ebe ha na-achụ nta PVC ha, na ha na ndị ahịa nọ na nkwekọrịta.
Ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị otiegwu a ma ama ewepụtakwuola oge ha na ụbọchị ha iji chụọ nta PVC na mpaghara Legọs dị iche iche.
Ha mere ya ka ọ bụrụ na tupu ị bata n'ọgbọ ebe ha ga-anọ eti ya bụ egwu, ị ga-ejirịrị PVC gị.












