PVC registration: Etu ndị mmadụ si achụso inweta PVC ha

Oku inweta akwụkwọ e ji atụ vootu nke Bekee kpọrọ 'Permanent Voters Card' (PVC) ebirila ọkụ na mpaghara Naịjiria dị iche iche n'izu ole na ole gara aga.
Dịka ihe siri kwụrụ ugbua,ọtụtụ ndị mmadụ ekpebiela na ha ga-esorịrị tụọ vootu a ga-eji họpụta onye ga-achị Naịjiria dịka onyeisiala na ntuliaka afọ 2023 maka afọ anọ na-eso ya.
Dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) si kwuo, ọnụgụgụ ndị na-edebanye aha ha ịnata PVC ha arịwala elu.
Mbọ inweta PVC
Ndị mmadụ ewepụtala atụmatụ dị iche iche isi maa ọkwa ma hụ na ndị mmadụ ga-etozu ịtụ vootu na ya bụ ntuliaka a ga-eme n'afọ 2023.
Na mpaghara dị iche iche, ndị ntorobia zikọrịtara onwe ha ozi na soshal midia ka ha gbakọọ hụ na ha debanyere aha ma nwee ike inweta ya bụ PVC.
N'Enugwu, ọkachasị ndị ntorobịa bụ ndị na-agbakọ n'Okpara Square kemgbe izu a, dịka ha na-agba mbọ ịhụ na ha debanyere aha ha maka nnata PVC.



Na Legọs, ndị ahịa Alaba International Market mara ọkwa ka ndị mmadụ ghara ịbịa ahịa echi bụ Tọzde, abalị itoolu nke ọnwa Juun, 2022.
Ha kwuru ka onye ukwu na onye nta na-azụ ahịa ebe ahụ gbaa mbọ gaa nweta PVC nke ha.
Onyeisi gburugburu ndị na-azụ ahịa 'Electronics' n'ahịa ahụ bụ Paulinus Ugochukwu, gwara BBC Igbo na ha chọrọ ka ndị na-azụ ahịa nwee ike ịtụ vootu n'afọ 2023, n'ihi na ọ bụ "ọrụ dịịrị gị dịka nwa amaala".
O kwuru na ọ bụrụ na ha emechighi ahịa na ndị mmadụ agaghị eje nata PVC nke bụ na ụbọchị ntuliaka ha agaghị ihe ha ga-eji tụọ vootu.
Maazị Ugochukwu kwuru na ọ bụ iwu ka ha tinyere, nke ha kpọrọ "Operation show your PVC", ma kwuo na ha chọrọ ka ndị ahịa ndị ọzọ ṅomie atụmatụ ha a.
O kwuru na oge ga-abịa mgbe ha ga-eme ya ka ọ bụrụ na i jighi PVC gị, agaghị ekwe gị bata ime ahịa.
O kwuru na enweghi ihe o mere ma ọ bụrụ na otu ụbọchị fulaghị ha ebe ha na-achụ nta PVC ha, na ha na ndị ahịa nọ na nkwekọrịta.
Ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị otiegwu a ma ama ewepụtakwuola oge ha na ụbọchị ha iji chụọ nta PVC na mpaghara Legọs dị iche iche.
Ha mere ya ka ọ bụrụ na tupu ị bata n'ọgbọ ebe ha ga-anọ eti ya bụ egwu, ị ga-ejirịrị PVC gị.
Etu ndị mmadụ si nweta PVC ha na mpaghara

Etu ọ kwụ ugbua n'Ọwụwa Anyanwụ










