Etu ị ga-esi nweta 'Permanent Voters Card' gị

Ndị ọrụ Inec

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Inec: Bia nara PVC gị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Igbo sị na ọ dị mkpa ibido n'oge chụwa ewu ojii maka chi ojiji.

Dịka ntuliaka onyeisiala Naịjirịa na-akpụdebe nso, ọ dị oke mkpa na ndị mmadụ ma ka ha ga-esi nweta mpempe akwụkwọ rọba Bekee kpọrọ "Permanent Voters Card (PVC)" nke ga-enyere ha aka isonye na ntuliaka a ga-eme n'afọ 2023.

Nke a dị mkpa makana ndị ka gbachara afọ iri na asatọ (18) ọhụrụ a, ndị PVC ha gbajiri maọbụ ndị nke ha furu efu, ga-enwe ohere inweta.

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec), emeghelarị ụzọ maka ndị dị otu a, kemgbe ọnwa Juun 2021 maka ịgbata akwụkwọ ikike a dị oke mkpa.

Aha onyonyo, Etu ị ga-esi kwado onwe gị maka ntuliaka

Ha wepụtakwara usoro e ji agbata ya bụ akwụkwọ ikike.

Akwụkwọ ikike ntuliaka Naịjirịa akpọrọ PVC na Bekee

Ebe foto si, INEC NIGERIA/FACEBOOK

Nkọwa foto, PVC ndị anatabeghị nke ha

Ka ị ga-esi nweta PVC gị

E nwere usoro abụọ ị nwereike iji nweta PVC gị:

1) Nke "Online"

Ndị chọrọ iji aka ha gbata PVC ga-ebu ụzọ gaa n'ịntanetị, n'ọbaozi ndị Inec maka itinye aha ya, zaa ajụjụ niile a jụrụ ya ebe ahụ tupu ha ebiputa ya.

Onye mehiere aka mgbe ọ nwetachagoro PVC ya nwekwara ike ịdegharị ya "online", maọbụ onye chọrọ ịgafere obodo ọzọ chọrọ itu vootu n'obi ọhụrụ ya ga-emekwa otu ahụ.

Mgbe ị mechara nke "Online", ihe ọzọ bụ iwere mbiputa ya gawa n'ụlọọrụ ndị Inec.

Ndị na-anata kaadị

Ebe foto si, Getty Images

2) Ịga n'ụlọọrụ ndị Inec

Onye ahụ ga-ewere akwụkwọ mbiputa ahụ ọ biputara na kọmputa nye ndị ọrụ Inec dị n'isi ụlọọrụ okpuruọchịchị ha maọbụ ebe ndị ọzọ Inec wepụtara.

Ndị Inec ga-ewerezi ya bụ akwụkwọ ma nye ya mpempe akwụkwọ nke ha kpọrọ "Temporary Voters Card".

Inec dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ ghara idebanye aha ugboro abụọ n'ọbaozi ndị Inec, maọbụ kpota PVC adịgboroja maka na ime otu a nwereike ibutere onye ahụ ịga mkpọrọ.

Gịnị bụ PVC?

PVC bụ nke Bekee kpọrọ Permanent Voters Card.

Mpempe akwụkwọ rọba a bụ akwụkwọ ikike gọomentị na-enye iji tụọ vootu na ntuliaka na Naịjirịa.

O nwere edemede maka ihe niile onye ji ya nwere; aha, nkọwa onye ahụ na ihe ndị ọzọ.

Ọ bụ akụrungwa 'card reader' ka e ji agụta ihe dị na ya tupu e jiri ya tụọ vootu.

Voters card ọ na-agba ụka?

Odeakwụkwọ mgbasa ozi ndị Inec bụ Rotimi Oyekanmi, sị na PVC anaghị agba ụka ọbụla.

Oyekanmi dere na Twitter ya n'ụbọchị Wenezde, 19 nke ọnwa Jenụwarị 2022, na PVC nke Inec na-enye anaghị agba ụka ọbụla.

Voters card
Nkọwa foto, PVC adịgboroja

Ọ sị na "ọ bụrụhaala na akara nchekwa ya e dere na ya ehichabeghị, ọ ka dị ire".

Ajụjụ ma PVC ọ na-emebi emebi malitere mgbe Bola Ahmed Tinubu bụ onye ndu ndị pati nọ n'ọchịchị ugbua, All Progressive Congress (APC), pụtara tie mkpu na-asị "ha agaghị agwa gị n'oge... PVC unu agbaala ụka".

Bola Tinubu

Ebe foto si, Getty Images

Ka ọ na-ekwu okwu n'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia kemgbe Wenezde, Tinubu bụbu gọvanọ Legọs steeti ma bụrụkwa onye nwere mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, kwukwara na "ntuliaka na-agbada maka na PVC na-agba ụka".

O kwuru ihe ndị a n'ọgbakọ ụmụnwaanyị ndị APC, n'ụbọchị Wenezde, n'Abuja.

Igwe card reader eji eme ntuliaka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka

Mana ọnụ na-ekwuru Tinubu bụ Tunde Rahman, ekwuola na ọ bụghi ihe ndị mmadụ che ka onyeisi ya kwuru.

Rahman kwuru na ọ bụ ọnụ ka Tinubu kwughiere, na ihe ọnyeisi ya chọbụru ikwu bụ ka "ndị mmadụ gbaa mbọ gaa hụ na PVC ha tozuru etozu".

Rahman sị "Tinubu arịọlarị mgbaghara maka ya bụ ihe o kwuru, na-ekwu na o wutere ya maka ya bụ okwu nduhie o kwuru".