Bimodial Voting Accreditation System: Gịnị bụ 'BVAS' butere ọgbatuhie na ntuliaka Anambra Novemba 6?

Igwe BVAS bụ Bimodial Voting Accreditation System (BVAS) e ji edenye aha na njirimara mmadụ 06-11-2021
Nkọwa foto, Igwe BVAS bụ Bimodial Voting Accreditation System (BVAS) e ji edenye aha na njirimara ndị pụtara ịtụ vootu

BVAS bụ Bimodial Voting Accreditation System (BVAS) bụkwa akụrụngwa ọhụrụ ụlọọrụ Inec na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa wepụtara e ji mee ntụliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

Ntụlịaka ahụ nke mere n'ụbochị 6 nke ọnwa Nọvemba dọtịrị ruo ụbọchị 7 nke ọkwa Nọvemba maka ọgbatuhie ya bụ akụrụngwa butere.

Ọ bụ na nzụkọ ndị ntuliaka metụtara na onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu wepụtara mbụ ma kwuo na-aga eji ya mee ntuliaka Anambra steeti na-abịa.

Akụrụngwa BVAS bụ Bimodial Voting Accreditation System (BVAS)
Nkọwa foto, Akụrụngwa BVAS bụ Bimodial Voting Accreditation System (BVAS)

Igwe ahụ nwereike ịwepụta aha ndị denyere aha ntuliaka sịte na njirmara mkpisi aka ha nakwa ihu ha.

Nke a bụ iji kwụsị ndị chọrọ iji Permanent Voter's Card (PVC) onye ọzọ mee nrụrụaka na ntuliaka ọbụla.

Yakubu kwuru na agaghịzị e ji 'incident form' mee ntuliaka ọzọ n'ihi igwe a.

Onye ji igwe BVAS eleru mmadụ anya

Ọ bụkwa naanị ndị denyere aha n'uju ma nwee PVC ha ga-enwe ike ịme ntuliaka a eji BVAS e me.

Onye ọbụla igwe BVAS bụ Bimodial Voting Accreditation System (BVAS) a chọpụtaghị aha ya agaghị enweike mee ntuliaka nke mere na o butere nsogbu na ntuliaka Anambra steeti dịka igwe ahụ wụrụ ndị mmadụ n'ala.

Inec na nkọwa ha kwuru na "anyị amalitela nnyocha banyere ihe mere ọtụtụ igwe BVAS ejighi rụ ọrụ taa".

Igwe BVAS
Nkọwa foto, Igwe BVAS ọtụtụ arụghị ọrụ na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra e mere n'ụbọchị 6 ọnwa Nọvemba nke mere ka Inec dọtịkwuo ya rue ụbọchị 7 ọnwa Nọvemba.

Cheta na ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa nyere Inec ikike iji igwe teknụzụ wepụta mpụtara ntuliaka ọbụla a ga-eme na Naịjirịa.

Mana ha kwuru na Inec ga-anata ikike ọzọ n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi bụ NCC tupu ha enweike mee nke a.

Aha onyonyo, Anambra Elections 2021: Ihe mere ntụliaka Anambra ji e me n'afọ dị iche karịa ndị ọzọ